Brain Jotter: Atụghị m anya na 'Gwo gwo gwo ngwo' ga-ewu ewu site n'iho onyonyo m mere

Aha onyonyo, Brain Jotter: Atụghị m anya na 'Gwo gwo gwo ngwo' ga-ewu ewu site n'iho onyonyo m
Brain Jotter: Atụghị m anya na 'Gwo gwo gwo ngwo' ga-ewu ewu site n'iho onyonyo m mere
    • Onye dere ya, Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Ọkpaọchị n'ihe onyonyo bụ Brain Jotter akọwaala etu obi dị ya maka ihe onyonyo o mere, nke bupụtara egwu 'Gwo gwo gwo ngwo' nke Mike Ejeagha.

Na mkparịtaụka ya BBC Igbo nwere, nwamadị a ezigbo aha ya bụ Chukwuebuka Emmanuel Amuzie kwuru na o bughi n'obi na ihe onyonyo 'Gwo gwo gwo ngwo' nke o ji egwu Mike Ejeagha mee nwereike iwu na mbaụwa.

O kwuru na etu egwu ahụ a kpọrọ 'Ka e si lee onyeisi oche' si na-ewu bụ ihe Chukwu kwadoro na ọ bụghị site n'aka nke ya.

Brain Jotter kwuru na o nweghi ego ọbụla o ritere site n'egwu ahụ na-ewu ewu kama na obi juru ya afọ site n'ekele ndị mmadụ na-enye nakwa nke a siri metụta otiegwu Mike Ejeagha.

Ọ gara n'ihu kwuo na nleta ọ gara leta Ejeagha ma nye ya ego bụ etu obi ụtọ ma ojuju afọ nye ya.

Brain Jotter kwuru na ọ malitere ime ihe nyonyo ịkpaọchị n'afọ 2019, na ihe mere oji eyi uwe akwụkwọ ndụ ndụ bụ maka na ọ bụ uwe oyi mgbe ọ malitere.

"A mailtere m ime ihe onyonyo ịkpaọchị n'afọ 2019, ọ bụghị taa.

"Uwe ndụ ndụ m na-eyi bụ nke m yi mee ihe onyonyo nke mbụ m mana e tinyeghi aha na ya, nke a mere m ji kpebie i na-eyi uwe ahụ ka ndị mmadụ jiri ya maara m.

"Egwu m na-agba n'ihe onyonyo bụ egwu dị n'ime ahụ, abụghị ọgba egwu kama ihe batara m n'uche ka m na-agba."

Cheta na nwamadị a bụ Brain Jotter ji egwu Mike Ejeagha nwere egwu "Gwo gwo gwo ngwo" mee ihe onyonyo, nke mere ka egwu ahụ malite iwu na soshal midia ma gazuo ọtụtụ mba.

Kirie ihe o kwuru n'uju;