Mike Ejeagha: Etu ndị ntoroọbịa sị tụkọta ego ma rụzie ụlọ ochie ya

Aha onyonyo, Mike Ejeagha: Etu ndị ntoroọbịa sị tụkọta ego na Facebook ma rụzie ụlọ ochie ya

Ụfọdụ ndị ntoroọbịa gbakọtara aka na Facebook ma tụkọta ego iji rụziere oti egwu a ma ama bụ Mike Ejeagha ụlọ ochie ya dị n'Enugwu.

Ha sị na ha mere nke a iji kwanyere ya ukwu dịka ọ na-akwado ịgba afọ iri itoolu na otu.

Ndị ndu ndị a gụnyere Amarachi Attamah na Charles Ogbu gwara BBC Igbo ihe nke Mike Ejeagha bụ nye ha nakwa ndị Igbo niile nke mere ha ji meere ya ihe a.

Mike Ejeagha n'ọnwa gosiri obi ụtọ ya ma kọwaa na agwa ndị ntoroọbịa kpara enyela ya olileanya ọhụrụ na ndụ.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;

Ndị mere ihe onyonyo: Ebere Ekeokpara na Chiemela Peters

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: