Chelsea vs West Brom: E meela Chelsea tụtụrụ fụchaa, gbaa ha ọtọ ka ụwa hụ

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea ji akpa kpojuo goolu afọ n'ihe bụ mmeri mbụ ha na-enweta kemgbe Thomas Tuchel ji bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha.
Ndị West Brom emereghị ha ebere dịka ha ji goolu ise chara acha asatara naanị abụọ merie ha n'azụ ụlọ ha na Stamford Bridge.
Chelsea buru ụzọ ghọrọ agụ mgbe ha nyere otu goolu na nkeji 27 e ji bido bọọlụ, mana West Brom ji iwe gaa ṅụọ akpụrụachịa wee bịa gwepịa ha ka ose a kwọrọ akwọ.
Matheus Pereira nyere goolu abụọ n'ime ihe na-erughi nkeji atọ e tinyekwuru tupu e gbuchie ọkara nke mbụ.
Callum Robinson mezuru ya atọ na nkeji 63 tupu Mbaye Diagne emezuo ya anọ na nkeji 68.
Ka ọ dị ka Chelsea ekuteturu obere ume, Mason Mount nyere otu goolu na nkeji 71 iji tinyetu ndị Chelsea ọchị n'ihu, mana Callum Robinson jikwa iwe hichapụ ọchị ahụ n'otu nkeji a tụkwasịrị na nkeji 90 e ji agbazu bọọlụ.
Mara na Chelsea dị mmadụ 10 gbazuo bọọlụ dịka a chụpụrụ Thiago Silva bụ onye egwu azụ ha na nkeji 29.
Mara na West Brom na-azọ isi onwe ha n'ogogo 19 na tebulu Premier League, ebe Chelsea ha sụrụ ka akwụ nọ n'ogogo anọ.
Naanị ụbọchị anọ ka Chelsea nwere izutetu ike tupu ha-ezute Porto n'asọmpi Champions League.










