VDM na Bobrisky: "Bobrisky jiri ọnụ ya kwuo na ọ gaghị ụlọmkpọrọ, kedụ ebe ọ gara n'ezi a?" - Deji Adeyanju

Aha onyonyo, Ọkaịwu Deji Adeyanju bụ ọkaiwu VeryDarkMan wepụtara ohere kọwaara anyị ka eke si anya anwụ.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Dịka okwu ebubo nrụrụaka Idris Okuneye a maara dịka Bobrisky boro ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ EFCC na-aga n'ihu, e nweela ọtụtụ ihe mpụta ihe n'okwu ahụ.

Cheta na okwu a malitere oge nwoke a na-akpọ Martins Vincent Otse a mara dịka Very Dark Man (VDM) kesara mkparịtaụka Bobrisky na otu onye nwere na soshal mịdịa ya nke kwụrụ na Bobrisky onye a tụrụ mkpọrọ ọnwa isii, agaghị ụlọmkpọrọ ma ncha.

Ka okwu ebubo ahụ gbara n'anwụ, cheta na ụlọ omeiwu nta Naịjirịa kpọrọ ọkụ ka Bobrisky, VDM na ndị ọzọ a kpọrọ aha n'ebubo ahụ ka ha wuchie n'ụlọọrụ ha iji zara ọnụ ha mana Bobrisky azaghi ọkụ ahụ, kama ọ zigara ọkaiwu iwu.

Ọkaịwu Deji Adeyanju bụ ọkaiwu VeryDarkMan wepụtara ohere kọwara anyị ka eke si anya anwụ n'okwu ebubo ahụ.

Ọ katọrọ atụmatụ na usoro gọọmenti ji eso okwu ma kwuo na ọ dị mwute na gọọmenti hapụrụ onye ndị kpara arụ ma na-achụ onye gbara arụ ahụ n'anwu.