Ị hụla ụmụokoroọbịa abụọ a kachasị mma tuuru ugo n'ịmaaka 'Mr. Nigeria'?
Ụmụokoroọbịa abụọ maara mma gbapụtara ihe n'ịmaaka ihe ngosi Mr. Nigeria akọwaala etu ha siri banye n'ime ihe ngosi a kpọrọ 'Modelling' na Bekee.
Na mkparịtaụka pụrụiche ha na BBC Igbo nwere mmadụ abụọ gbara onye mbụ na onye abụọ n'ịmaaka ihe ngosi ahụ kọwaara ihe gbalitere mmụọ ha n'isonye n'emume ahụ.
Onye tuurugo n'ịmaaka ahụ bụ Michael Maz-Michael kwuru na o bidoro ime ihe ngosi n'afọ 2020 oge ahụ ọrịa coronavirus na-akpa ike n'ụwa.
O kwuru na o tinyeburu akwụkwọ inwete ọrụ dịka onye ọrụ ahụike nọọsụ mana a gwara ya chere na ọrụ agaghị amalite ruo mgbe ọrịa coronavirus ga-akwụsịlata.
Michael kwuru na ọ jụrụ onwe ya kedụ ihe ọ ga-eme ugbua iji chere oge? Mana o chetere na ndị mmadụ na-ajụ ya 'ị na-atụ bọọlụ nkata ka ị na-eme ihe ngosi?'.
O kwuru na ajụjụ ndị ahụ kpaliri mmụọ i bido ịtụ bọọlụ nkata ma meecha banyezie n'ime ihe ngosi – bụ ebe o tuuru ugo dịka nwokoroọbịa kachasị mma na Naịjirịa.
N'aka nke ọzọ, onye gbara onye nke abụọ n'ịmaaka ihe ngosi Mr. Nigeria bụ Christopher Iroegbulam kọwaara na o nwere mmasị n'ime ihe ngosi kamgbe ọ dị na nwata.
O kwuru na ọ na-amasị ya nke ukwuu ịpụta n'ihu ihe onyonyo - ịbụ onye a ma ama. Iroegbulam kwuru na echiche ahụ ka o jiri too ma malite ime ihe ngosi dị iche iche, ebe o tuurula ugo n'ụfọdụ ha.
O kwuru na o mechara bụrụ onye na-ahazi ụfọdụ ihe ịmaaka ngosi n'oge ọ ka nọ na mahadum.
Kirie ihe ha kwuru n'uju;



