Miss Universe 2023: Ọ bụghị naanị mma ihu na mma ahụ ka a na-ele anya – Ihezue Ugochi Mitchel

Aha onyonyo, Miss Universe 2023: Ọ bụghị naanị mma ihu na mma ahụ ka a na-ele – Ihezue Ugochi Mitchel
Miss Universe 2023: Ọ bụghị naanị mma ihu na mma ahụ ka a na-ele anya – Ihezue Ugochi Mitchel
    • Onye dere ya, Amaka Bassey, Kelechi Anozia & Chioma Nkemdilim Daramola
    • Ndị mere akụkọ a, Digital Technical Producer, Video Journalist & Senior Journalist

Ihezue Ugochi Mitchel bụ agbọghọ ga-anọchite anya Naịjirịa na Miss Universe a ga-eme n’ụbọchị 18 Nọvemba 2023 n’El Salvador akọwaala etu o siri malite isonye na mmemme ọkachamma.

Ugochi dị afọ 27, ma too ogo nwaanyị nwere akara ugo mmụta bachelọ na Fine and Applied Arts sitere University of Benin.

O nwekwara MBA abụọ nke Lagos Business School na IESEG School of Management Paris nyere ya.

Ọ malitere ọrụ dịka onye a na-eji egosi ejiji mgbe o sonyere na asọmpi Elite Model Look nke Beth Model Management mere n’afọ 2015, ebe o ruru ndị ise kacha elu, nke mere Beth Model Management jiri nye ya ọrụ.

Ya na ọtụtụ ndị na-emepụta ejiji arụkọọla ọrụ.

N’afọ 2017, o sonyere n’asọmpi Most Beautiful Girl in Nigeria (MBGN) nke o meriri.

Nke a nyere ya ohere ịnọchite Naịjirịa na Miss World e mere na Sanya, China ebe ọ tụrụ ugo Miss World Top Model; ma bụrụkwa nwaanyị kacha mma rutere ndị iri na ise (top 15) kacha elu, kamgbe Agbani Darego jiri mee nke a na 2001.

Ugbua onweela ohere igosi ụwa na Naịjirịa nwere ihe dị mma na Miss Universe, site n’igosi na ihe ụmụnwaanyị nwereike ime karịrị.

Ugochi Ihezue
Nkọwa foto, Ugochi Ihezue