Desire Oparanozie Retires: Ihe mere m ji kpebie ịla ezumike n’egwurgwu bọọlụ n’oge

Aha onyonyo, Desire Oparanozie Retires: Ihe mere m ji kpebie ịla ezumike n’egwurgwu bọọlụ n’oge
Desire Oparanozie Retires: Ihe mere m ji kpebie ịla ezumike n’egwurgwu bọọlụ n’oge
Desire Oparanozie
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi, Amaka Bassey & Chioma Nkemdilim Daramola
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Digital Technical Producer & Senior Journalist

Ọ tụrụ ọtụtụ mmadụ n’anya dịka ọgba bọọlụ Naijirịa bụ Desire Ugochi Oparanozie kwupụtara n’ụbọchị 13 nke ọnwa Septemba 2013, na ya ga-ala ezumike n’egwuregwu bọọlụ.

Oparanozie, onye dị naanị afọ 29, n’ozi ahụ o wepụtara n’akara Twitter ya, kelere ndị niile nyere ya ezi nkwado na njem ya dịka ọgba bọọlụ ma na Naịjirịa ma na mba dị icheiche ebe ọ gbara bọọlụ n’otu bọọlụ dị icheiche.

Mana na mkparịtaụka pụrụ iche nke ya na BBC Igbo nwere, Oparanozie kọwara ihe mere ya ji kpebie ịkwụsị ịgba bọọlụ ugbua, ma kwuo na ọ bụghị n’ihi mmanye ọbụla.

“O teela m kpebiri na ọ ga-abụ n’afọ 2023 ka ma ga-awụsa ọwa n’egwuregwu bọọlụ,” Oparanozie kwuru.

“Achọrọ ka m nwewanye ohere maka ndị ezinụlọ m, agụmakwụkwọ m nke na-aga n’ihu na Mahadum na mba England, otu enyemaka m hibere bụ ‘Desire Oparanozie Foundation’, nakwa ihe ndị ọzọ m na-eme.”

Oparanozie gara n’ihu kọọ akụko etu o si gbaa mbọ iji kwụsị mmegbu nke ọ sị na otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ ‘Nigeria Football Federation’ (NFF) na-emegbu ndị otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ ‘Super Falcons’.

Ọgụ a Oparanozie lụrụ maka ịkwalite ikike dịịrị ndị ọgba bọọlụ, nakwa ime ka NFF kwụọ ha ego e ji ha n’ụgwọ ọtụtụ afọ gara aga, mere ka ha napụ Oparanozie ọkwa ‘Captain’ n’afọ 2019, mekwaa ka a chụpụ ya n’otu ‘Falcons’.

“O wuteghị m nke ukwuu n’oge ahụ maka na emere m ihe m kwesịrị ime dịka onye ndu ndị otu ‘Super Falcons’... Obi ụtọ m bụ na enweela ihe dị iche ugbua n’etu ndị NFF si akpaso ndị ‘Super Falcons’ agwa. Ọ bụ eziokwu na ihe niile adịchabeghị mma taa, mana ihe dị iche adịtụla,” Oparanozie kwuru.

Gere mkparịtaụka BBC na Desire Oparanozie n’uju n’ihe onyonyo dị n’elu.