Ihe mere anyị jiri zaa oku ịgbara Naịjirịa bọọlụ - Ụmụnwaanyị Super Falcons

Aha onyonyo, Wafcon 2022: "Ihe mere anyị jiri zaa oku ịgbara Naịjirịa bọọlụ"
Ihe mere anyị jiri zaa oku ịgbara Naịjirịa bọọlụ - Ụmụnwaanyị Super Falcons

Ufọdụ ndị otu Super Falcons nke Naịjirịa bụ ndị a mụrụ n'ala Bekee ekwuola ihe mere ha jiri kpebie ịgbara Naịjirịa bọọlụ.

Ndị ọgba bọọlụ a gụnyere Mitchelle Alozie, Ashleigh Plumptre, Ifeoma Onumonu, Nicole Payne na nwanne ya bụ Toni Payne.

Ha kọwara na ọ bụ mmasị ha nwere n'ebe otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa nọ mere ha jiri kpebie ịza oku ịgbara Naịjirịa bọọlụ mgbe a kpọrọ ha.

Nke ọzọ bụkwa na ha chọrọ ka ha na agbụrụ nnanna ha ochie nwee mmekọrịta.

Super Falcons

Ebe foto si, Instagram

Ụmụ nwaanyị ndị a gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na a mụrụ ha na mba ndị dịka Amerịka maọbụ Briten, mana ha nwere agbụrụ n'ala Igbo nakwa Yoruba nke Naịjirịa.

Ha kwuru na ọ ga-amasị ha ịmụta ọtụtụ omenala agbụrụ ha na Naịjirịa.

Kirie ihe onyonyo a maka ihe ha kwuru n'uju.