Etu ndị Super Falcons nke Naịjirịa si eke ekike oge ha anaghị agba bọọlụ

Asọmpi iko mba ụwa ụmụnwaanyị nke Afrịka na-aga n'ihu ugbua, ebe ndị Super Falcons nke Naịjirịa na-agba mbọ ibute iko a.
Asọmpi nke mbụ ha ga-abụ n'ụbọchị Mọnde oge ha na ụmụnwaanyị Saụt Afrịka ga-ezute.
Mana dịka ha na-akwado asọmpi ahụ, ka anyị buru ụzọ gosi gị ụmụasa ndị ga agbara Naịjirị bọọlụ n’asọmpi a.
Asisat Oshoala

Ebe foto si, Asisat Oshoala
Oshoala eritela ọtụtụ nturuugo n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa.
Ọ gbaarala ọtụtụ otu egwuregwu a ma ama.
Mana ekike ya mgbe ọ naghị agba bọọlụ na-achabakwa ọtụtụ n'anya
Onome Ebi

Ebe foto si, Onome Ebi
Onome bụ ọgba bọọlụ riterela ọtụtụ nturuugo kamgbe ọ gbawara otu Falcons.
A mụrụ Onome n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1983.
N’afọ 2019, ọ bụ nwafọ Afrịka mbụ gbarala asọmpi Iko Mbaụwa ugboro ise.
Ekike ya na-apụkarị ọkụ n’ịntaneti.
Ụdịrị isi na-amasị ya bụ ịkpụtu isi ya tee ya uhie ka ọ na-acha anwụanwụ.
Chiamaka Nnadozie

Ebe foto si, Chiamaka Nnadozie
Ọ bụ mma nwata ka ị ga-elwe anya ka ọ bụ ọchị ya? Chiamaka Nnadozie nwere ha dum.
A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2000.
Otu egwuregwu ya na mba France bụ Paris FC.
Glory Ogbonna

Ebe foto si, Glory Ogbonna
Glory bụ nwafọ Igbo a mụrụ n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 1998.
Ọ na-agbara otu egwuregwu Santa Teresa FC dị na Spain.
Ọ na-ejikekarị ka ụmụnwoke mana mgbe ọbụla o jikere, njike ya na-apụ iche.
Osinachi Ohale

Ebe foto si, Osinachi Ohale
Osinachi bụ nwa ada topuru etopu, maa mma.
A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba, 1991.
Otu egwuregwu ya bụ Depotivo Alaves nke mba Spain.
Dịka anyị sikwa hụ, ejiji ya na-abụkarị ejiji yitewere nke ụmụnwoke.
Ashleigh Plumptre

Ebe foto si, ASHLEIGH PLUMPTRE
Nwaanyị ọcha a mụrụ na Leicester, England kpebiri n’onwe ya na ọ chọrọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ.
A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1998Ọ na mba Briten mana nna ya bụ onye Naịjirịa si na Legọs steeti.
Ọ malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n’ọnwa Febụwarị afọ 2022.
Otu egwuregwu ya bụ Leicester dị na mba UK.
Ngwa jiri anya hụ ka njike ya si adị mgbe ọ na-anaghị agba bọọlụ.
Nicole Payne na nwanne ya Toni Payne

Ebe foto si, Nicole Payne/Toni Payne
Ụmụnne abụọ a na-agbara otu ‘super falcon’ n’azụ na n’etiti.
A mụrụ Nicole n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2001, mụọ nwanne ya Toni n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1995, na mba Amerịka.
Ị hụ ha abụọ jikere, ị ga-eche na ha bụ ndị na-eyiputere ndị mmadụ akwa.
Ị gaghị ama na ụmụ asa a ji ịgba bọọlụ mere akaraka.
Michelle Alozie

Ebe foto si, Michelle Alozie
Michelle bụkwa nwada ọzọ njike ya na-apụ ọkụ na soshal midia.
Ọ bụ nwata na-anaghị atụ ụjọ igosipụta akụkụ ahụ ya na soshal midia n’ejiji ọ na-eyi.
Ngwa gbaara anya gị ekeresimesi.
Francisca Ordega

Ebe foto si, Francisca Ordega
Kedụ ihe anyị agaghị ekwu maka Francisca?
Nwaanyị ma agba bọọlụ, maa mma, ejiji ya bụrụzie elelebe eje ọrụ.
Ngwa gbaara anya gị ekeresimesi.
Rasheedat Ajibade

Ebe foto si, Rasheedat Ajibade
Ajibade bụ ọmarịcha nwa ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ma ọfụma.
A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1996.
Otu egwuregwu ya bụ Minsk FC dị na Belarus.
Ọ na-achaba gị n’anya? Mee ngwangwa maka na dịka Rasheedat si kwuo n’ọba soshal midia ya, ọ naghịkwa eche onye ọbụla.

Ebe foto si, Rasheedat Ajibade
Ngozi Okobi-Okeghene

Ebe foto si, Ngozi Okobi-Okeghene
A mụrụ Nogzi n’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 1993.
Ọ na-agbara otu egwuregwu Eskilstuna United nke mba Sweden.
Rita Chikwelu

Ebe foto si, Rita Chikwelu
O teela Rita gbawarala ụmụnwaanyị Naịjirịa bọọlụ.
A mụrụ ya n’ụbọchị isii nke ọnwa Maachị afọ 1998.
Otu egwuregwu ya bụ Madrid CFF di na Spain
Ọ bụ nwaanyị ejiji ya na-eyitekwa nke nwoke, nke mere ụfọdụ ji ekwu na o nwere 'swag'.
Halimatu Ayinde

Ebe foto si, Halimatu Ayinde
Ayinde gbabuuru otu 'Delta Queens' na Naịjirịa tupu ọ gaa ala bekee.
Ọ dị afọ iri abụọ na asaa.
Ugbua ọ na-agbara otu Eskilstuna United DFF nke mba Sweden.
Regina Otu

Ebe foto si, Regina Otu
Christu Ucheibe

Ebe foto si, Christy Ucheibe
Peace Efih

Ebe foto si, Christy Ucheibe
Uchenna Kanu

Ebe foto si, Uchenna Kanu
Ifeoma Onumonu

Ebe foto si, Ifeoma Onumonu
Vivian Ikechukwu

Ebe foto si, Vivian Ikechukwu
Chinonyerem Macleans

Ebe foto si, Chinonyerem Macleans
Toochukwu Oluehi

Ebe foto si, Toochukwu Oluehi
Ọ bụ Oluehi na-eyi uwe e dere 1 n'otu ndị Super Falcons.
A mụrụ ya n’ ubọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1987.
Yewande Balogun

Ebe foto si, Yewande Balogun
O nweghi onye ka mma iji pịachie akụkọ a karịa Yewande.
A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 1983.
Yewande bụ nwaanyị topuru etopu, maa mma nwee nnọọ ihu ọchị.
Ekike ya bụkwa nke a na-anaghị ahụ ewepụ anya ngwangwa.
Otu egwuregwu ya dị n’Amerịka bụ Coppermine United









