African Women Cup of Nations 2022: Lee ụmụasa ga-anọchiteanya Naịjirịa n'asọmpi a

Foto na-egosi ụmụnwaanyị egwu bọọlụ Naịjirịa nke Super Falcons

Ebe foto si, Getty Images

Asọmpi Iko Mba Afrịka ụmụnwaanyị nke ugboro iri na anọ ga-ebiri ọkụ na Satọde 2, Julaị 2022 na mba Moroko.

Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons ga-eso ụmụagbọghọ ibe ha pụta n'ọgbọ.

Super Falcons bụ ọkaibe n'Afrika ma a bịa n'asọmpi a dịka ha maburula iko a ugboro iri na otu n’ime iri na atọ a gbarala ya.

Na mbido asọmpi a, ha ga-ezute ọgbọ ha ndị dịka Saụt Afrika, Burundi na Botswana.

Ụmụagbọghọ iri abụọ na ise na-agba bọọlụ n'otu egwuregwu dị icheiche n'ụwa ga-anọchiteanya Naịjirịa n'asọmpi a.

Ndị a gụnyere:

Chiamaka

Ebe foto si, Chiamaka Instagram

Chiamaka Nnadozie

Ọ na-eyi uwe e dere akara iri na isii

Ọ bụ otu n’ime ndị oche goolu ndị Super Falcons

Otu egwuregwu ya bụ Paris FC dị na mba France

A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Disemba, afọ 2000.

Akụkọ egwuregwu ndị ọzọ ga-amasị gị
Tochukwu Oluehi

Ebe foto si, Tochukwu/Instagram

Tochukwu Oluehi

Oluehi na-eyi uwe e dere 1,

Ọ na-echere ndị Super Falcons bọọlụ

Otu egwuregwu ya bụ Maccabi Kishronot Hadera dị na mba Isreal

A mụrụ ya n’ ubọchị abụọ nke ọnwa Mee afọ 1987.

Yewande Balogun

Ebe foto si, Yewande

Yewande Balogun

Ọ na-echere ndị Super Falcons goolu

A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 1983

Otu egwuregwu ya bụ Coppermine United dị n’Amerịka

Onome Ebi

Ebe foto si, Onome Instagram

 Onome Ebi

Ọ na-eyi uwe e dere akara ise

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe azụ a kpọrọ ‘defence’ na Bekee

A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1983

Otu egwuregwu ya bụ Ev Avant Guingamp dị na France

N’afọ 2019 ọ bụ nwafọ Afrịka mbụ gbarala asọmpi Iko Mbaụwa ugboro ise

Michelle Alozi

Ọ bụkwa Nwafọ Naịjirịa a mụrụ n’Amerịka

Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1997

Otu egwuregwu ya bụ Houston Dash dị n’Amerịka

Glory Ogbonna

Ebe foto si, Getty Images

Glory Ogbonna

Ọ na-eyi uwe akara anọ

Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 1998

Otu egwuregwu ya bụ Santa Teresa FC dị na Spain

Osinachi Ohale

Ebe foto si, Getty Images

 Osinachi Ohale

Ọ na-eyi uwe akara atọ

Ọ na-agbara Falcons bọọlụ n’ebe etiti azụ (centre back)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba, 1991

Otu egwuregwu ya bụ Depotivo Alaves nke mba Spain

Ashleigh Plumptre

Ebe foto si, Getty Images

Ashleigh Plumptre

Ọ bụ nwafọ mba Briten mana nna ya bụ onye Naịjirịa (yoruba) si na Legọs steeti

Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender)

Ọ malitere ịgbara ha bọọlụ n’ọnwa Febụwarị afọ 2022.

A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee afọ 1998

Otu egwuregwu ya bụ Leicester dị na mba UK

Akudo Ogbonna

Ọ na-agbara Super Falcons n’ebe azụ (defender)

A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Eprelụ afọ 2000

Otu egwuregwu ya bụ Edo Queens dị na Naịjirịa

 Nicole Payne

Ebe foto si,  Nicole Payne/Instagram

 Nicole Payne

Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe azụ (defender)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2001

Otu egwuregwu ya bụ West Virginia University dị na mba Amerịka

Ya na nwanne ya nwaanyị bụ Toni Payne bụ ụmụnne abụọ nke mbụ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ otu oge.

Peace Efih

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2000.

Otu egwuregwu ya bụ Kiryat Gat dị na mba Israel

Ngozi Okobi

Ebe foto si, Getty Images

Ngozi Okobi

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 1993.

Otu egwuregwu ya bụ Eskilstuna United dị na mba Sweden.

Toni Payne

Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprelụ afọ 1995

Otu egwuregwu ya bụ Sevilla dị na mba Spain

Christy Ucheibe

Ebe foto si, Getty Images

Christy Ucheibe

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 2000

Otu egwuregwu ya bụ SL Benfica nke Portugal

Halimatu Ayinde

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri na isi nke ọnwa Mee afọ 1995

Otu egwuregwu ya bụ Eskilstuna United dị na mba Sweden

Regina Otu

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1996

Otu egwuregwu ya bụ Minsk FC dị na Belarus

 Rasheedat Ajibade

Ebe foto si, Getty Images

 Rasheedat Ajibade

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị asatọ ọnwa Disemba afọ 1999

Otu egwuregwu ya bụ Atletico Madrid mba Spain

Francesca Odega

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Ọktoba 1993

Otu egwuregwu ya bụ CSKA Moscow dị na Russia

Uchenna Kanu

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun 1997

Otu egwuregwu ya bụ Tigres Femenil nke Mexico

Rita Chikwelu

Ebe foto si, Getty Images

Rita Chikwelu

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe etiti (midfielder)

A mụrụ ya n’ụbọchị isii nke ọnwa Maachị afọ 1998

Otu egwuregwu ya bụ Madrid CFF di na Spain

Vivain Ikechukwu

Ebe foto si, Getty Images

Vivian Ikechukwu

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu ( forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri nke ọnwa Julaị afọ 1997

Otu egwuregwu ya bụ WFC Gintra dị na Lithuania.

Ifeoma Onumonu

Ọ bụ nwafọ Naịjirịa a mụrụ na mba Amerịka

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị afọ 1994

Otu egwuregwu ya bụ NY/NJ Gotham FC dị n’Amerịka.

Chinonyerem Mcleans

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 1999

Otu egwuregwu ya bụ GSK Gornik Leezna dị na Poland.

Asisat Oshoala

Ebe foto si, Getty Images

Asisat Oshoala

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọktoba afọ 1994

Otu egwuregwu ya bụ FC Barcelona di na Spain.

Gift Monday

Ọ na-agbara Super Falcons bọọlụ n’ebe ihu (forward)

A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2001

Otu egwuregwu ya bụ Bayelsa Queens nke Naịjirịa.

Randy

Ebe foto si, Getty Images

Randy Waldrum

Randy Waldrum bụ onye nchịkọta otu Super Falcons nke Naịjirịa.

Ọ bụ nwafọ mba Amerịka ihe egwuregwu bọọlụ doro anya.

A mụrụ ya n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Sepụtemba, afọ 1956.

Ọ bụkwa onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke mahadum Pittsburgh Panthers.