Happy Childrens Day: Lee ezinụlọ ụmụaka ha niile bụ ọpụrụiche n'egwuregwu

Aha onyonyo, Lee ezinụlọ ụmụaka ha niile bụ ọpụrụiche n'egwuregwu

Futubọọlụ, mmacha jimnastik na ịgba ọso bụ egwuregwu ụmụaka ezinụlọ a ji bụrụ ọkaibe ebe ụfodụ ụmụaka ibe ha nọ.

Nne ha bụ Amaka Onusiriuka akọowala etu o siri chọpụta akaraka egwuregwu ụmụ ya nwere.

Ada ya bụ Stephanie Onusiriuka na-eme ihe mmacha nke bụ Jimnastiks.

Ọ gaala ọtụtụ asọmpi ma turu ugo lọta.

Ọ bụ nsonso a ka ọ gara mba Saụt Afrịka maka asọmpị Jimnastik ma turukwa ugo lọta.

Ụmụnne ya ndị nwoke abụọ bụ egwuregwu boolụ ka ha jiri wachie ebe nke nwaanyị nke ọzọ bụ ịgba ọsọ masịrị ya.

Amaka na-akọwa etu ya na di ya si akwado ụmụ ha na ụfodụ ihe ndị chere ha aka mgba.

Ọ bụrụ na ịbụ ọkaibe site n'akaraka na-amasị gị, mara na akụkọ a bụ maka gị.