Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo.

Aha onyonyo, Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo.

N'oge gboo, ndị nne na-eji olu ike akpọtụrụ ụmụaka ha kpapụrụ akpapụ gaa igwu egwuregwu n'agbataobi ha maọbụ n'ama egwuregwu.

Ọ na-abụ nwantakịrị nụ olu nne ya, o jiri ọsọ jiri ije laruo ụlọ maka ụtarị.

•Otanjele, uri na ihe ntecha ndị ọzọ ụmụagbọghọ Igbo ji achọ mma mgbe gboo

•Uru egwu ọnwa bara na ọzụzụ na njikọ ndị Igbo

•Ekwensu ọ bụ 'satan' n'ala Igbo?

Oge ahụ ka ụmụaka mara etu e si enwe aṅụrị na etu e si egwu egwuregwu.

Oge ahụ, ndị mmadụ anaghị achịrị obi ha n'aka maka onye agbataobi ha, kama nwa bụ nwa ọha, nwantakịrị ọbụla nwereike ịga n'ụlọ onye agbataobi ya ọbụla soro ụmụaka ibe ya gwurutu egwu.

Egwuregwu akarịka nụ, tupe e mee nke a, mee nke ọzọ, chi a na-achọ iji, ụfọdụ oge, ụmụaka anaghị echeta dị na ha eribeghi nri.

Ọ dịzị ka ụfọdụ egwuregwu ahụ alachala maka na o nweghizi onye nwere ohere ha ugbua, nakwa egwu abịala ọtụtụ mmadụ, e nweghizi ntụkwasi obi ebe agbataobi nọ.

Mana, ọ dị mma ka anyị laghachitu azụ chetara gị ihe ndụ dịka ya oge oge gboo.