Eji m ụkwụ ụkpọrọ malite ịgba bọọlụ n'Aba - Uchenna Kanu
Uche Grace Kanu bụ nwa afọ Naijirịa na-agbara Super Falcons bọọlụ akọwaala etu o si malite ịgba bọọlu ma ruo n'ogogo ọ nọ ugbua.
Na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, Kanu sị na njem ịgba bọọlu ya malitere n'Aba mgbe ọ dị obere, oge ha na-agba ụkwụ ụkpọrọ agba bọọlụ dịka ihe egwuregwu.Eji m ụkwụ ụkpọrọ malite ịgba bọọlụ n'Aba - Uchenna Kanu
Kalu sị na ọ gbara bọọlụ n'ọtụtụ ebe n'Aba gụnyere Etche road, Okigwe road, Boys Technical College (BTC) dị na Faulks road.
Mana mgbe ọ malitere iji bọọlụ kpọrọ ihe bụ oge na ọ gbara otu egwuregwu 'Pepsi', Abia Angels mgbe a ka na-akpọ ha 'Standard Babes'.

Kanu sị na ọ bụ amara Chineke mere ka o ruo n'ogogo ọ nọ ugbua bụ ịgbara Super Falcons nke Naịjirịa nakwa Tigres Femenil nke Mexico bọọlụ.
Ọ gara n'ihu nye ndị na-agba bọọlụ chọrọ ịdị ka ya ndụmọdụ ka ha rubeisi, nwee umeala nakwa na-ege ndị nkuzi ha ntị.
Ọ sị na nke ka nke bụ ịtụkwasị Chineke obi, na ọ bụ ihe ndị a ga-enyere ha aka iru ogogo ha chọrọ.
Ihe I kwesịrị ịma maka Uchenna Kanu

Ebe foto si, uchenna_kanu_19/Instagram
- Uchenna bụ nwafọ obodo Amamba Uzuakoli dị n'okpuruochịchị Bende nke Abia Steeti.
- A mụrụ ya n'Aba n'ụbọchị 20 Juun, afọ 1997 nke pụtara na ọ bụ 'nwa Aba'.
- Ugbua ọ na-agbara Super Falcons nke Naịjirịa nakwa Tigres UANL Femenil nke Mexico bọọlu n'ebe ihu (forward).
- Otu egwuregwu ndị ọ gbaara bọọlụ gụnyere Southeastern Fire, Pensacola, Sevilla, Linkopings.



