A malitere m iti egwu na nwata - Rosemary Chukwu

Aha onyonyo, Ọ bụ mmụọ nsọ gwara m ka m gbanwee ekike m
A malitere m iti egwu na nwata - Rosemary Chukwu
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Onumaegbu sịrị na mmụọ nsọ zutere ya n'afọ 2007 mepee ya anya gbasara ike ekike na ịchọ mma.

Ebe foto si, Rosemary Chukwu/Instagram

Nkọwa foto, Ọ bụ mmụọ nsọ gwara m ka m gbanwee ekike m - Rosemary Chukwu
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

Otu n'ime ndị ochie dike a ma ama na-eti egwu ụka na Naịjirịa bụ Rosemary Chukwu Onumaegbu akọwaala na ọ bụ mmụọ nsọ nyere ya ntụziaka ka ọ gbanwee ekike ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Onumaegbu sịrị na mmụọ nsọ zutere ya n'afọ 2007 mepee ya anya gbasara ike ekike na ịchọ mma.

N'okwu ya, nwaanyị ahụ a mụrụ n'Enugwu steeti ma lụọ n'Abịa steeti sịrị "Mmụọ nsọ gwara m na ọ bụghị ike ekike maọbụ ịchọ mma bụ ife Chukwu."

Rosemary Chukwu Onumaegbu sịrị na ya nabatara Chukwu oge ọ ka dị na nwata nke mere ka o kwenye n'ihe niile ndị Ụkọchukwu kụziiri ya oge ahụ nke gụnyere na mmadụ ịchọ mma bụ mmehie.

Ọ gwara anyị na egwu mbụ o mepụtara ihe onyonyoo ya bụ egwu ya nke atọ ọ kpọrọ 'Oge Eruwo' mana ndị mmadụ kwuru okwu adịghị mma oge o mechara ya bụ ihe onyonyoo nke mere ka ọ mata na ekike ya adịghị mma dịka onye na-eto eto.

Ebe foto si, Rosemary Chukwu/Instagram

Nkọwa foto, Rosemary Chukwu

Ọ gwara anyị na egwu mbụ o mepụtara ihe onyonyoo ya bụ egwu ya nke atọ ọ kpọrọ 'Oge Eruwo' mana ndị mmadụ kwuru okwu adịghị mma oge o mechara ya bụ ihe onyonyoo nke mere ka ọ mata na ekike ya adịghị mma dịka onye na-eto eto.

Gbasara ịzụ mmadụ n'egwu, Onumaegbu sịrị na ya ekwenyeghị na a na-azụ mmadụ n'egwu n'ihi na egwu bụ onyinye amara Chukwu.

Ọ sịrị na "E nweghị onye m ga-asị na ọ bụ ya zụrụ m n'egwu mana ana m eme nke ọma. Naanị ihe dị mkpa bụ ka gị na mmụọ nsọ dịrị na mma."

Ọ gwara anyị na a mụrụ ya n'Ihuokpara dị n'Okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu steeti ma lụọ ya n'Isiala Ngwa dị n'Abịa steeti.