Ọnwụ Fada Tobias Okonkwo gbawara m obi – Peter Obi

Ọnwụ Fada Tobias Okonkwo gbawara m obi – Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi akatọọla ogbugbu ndị ojiegbe gburu onye Ụkọchukwu ụka Katolik bụ Rev. Tobias Chukwujekwu Okonkwo n'Anambra steeti.

N'ozi o bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Satọde 28 Disemba 2024, Obi kpọrọ oku ka a kwụsị ịkwafu ọbara ụmụ mmadụ aghara aghara na Naịjirịa.

Mpaghara ozi ahụ kwuru sị "etetara m ụra taa ma nweta akụkọ na-amapụ obi gbasara ọnwụ Rev. Fr. Tobias Okonkwo, bụ onye na-elekọta ụlọakwụkwọ College of Nursing Sciences nke ụlọogwụ Our Lady of Lourdes dị n'Ihiala".

"Ndị ojiegbe amatabeghị ndị ha bụ gbagburu Fr. Tobias n'Ihiala dị n'Anambra steeti n'abalị Fraịde. Etu ndị ogbu ara ọbara si egbu ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị bara uru bụ ihe na-agbawa obi," ka Peter Obi dere.

Ọ gara n'ihu kasie ezinaụlọ Ụkọchukwu ahụ, tinyere ndị isi na ụmụakwụkwọ College of Nursing Sciences obi maka ihe ike ahụ dakwasara ha ma rịọ ka Chineke nabata mkpụrụobi Fr Tobias na ndokwa.

Anyị ga-agba mmiri na ọbara iji hụ na a nwụchiri ndị gburu Fada Tobias Chukwujekwu – Ndị uweojii Anambra steeti

Kọmịshọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam akasiela ezinaụlọ, ndị enyi nakwa Dayọsis ụka Katọlik na Nnewi obi maka ọnwụ Rev. Tobias Chukwujekwu Okonkwo.

Ebe foto si, Anambra police command, Catholic Diocese of Nnewi/Facebook

Kọmịshọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam akasiela ezinaụlọ, ndị enyi nakwa Dayọsis ụka Katọlik na Nnewi obi maka ọnwụ Rev. Tobias Chukwujekwu Okonkwo.

Nke ahụ dị n'ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga binyere aka na ya n'ụbọchị Fraịde 27 Disemba 2024.

Ozi ahụ kwuru na "a na-ebo ebubo na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gburu Rev. Tobias Chukwujekwu Okonkwo n'okporoụzọ siri Ọnịcha gawa Owere n'uhuruchi Tọzde 26 Disemba 2024."

Ka o sinadị kọmịshọna ahụ kwuru na ndị uweojii ga-eme ihe niile dị ha n'aka iji hụ na a chọpụtara ndị aka ha dị n'ọnwụ Ụkọchukwu ahụ.

Ọ gwara ndị niile nwere ozi bara uru gbasara etu a ga-esi nwụchie ndị omekome ahụ ka ha gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso ma kwe nkwa na ha ga-ekpuchite onye ahụ.

Cheta na ụnyahụ ka Dayọsis ụka Katọlik na Nnewi wepụtara ozi kwuo na ndị ojiegbe wakporo ma gbagbuo Fada Tobias Chukwujekwu Okonkwo n'obodo Ihiala dị n'okporoụzọ si Ọnịcha gawa Owere.

Ihe anyị ma maka ogbugbu Fada Tobias Chukwujekwu nke ụka Katọlik n'Ihiala, Anambra Steeti

Ụkọchukwu Tobias Chukwujekwu Okonkwo gụrụ akwụkwọ na ngalaba ihe banyere nrụpụta ọgwụ a kpọrọ 'Pharmacy'.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nnewi/Facebook

Ulọụka Katọlik nke Dayọsis Nnewi akwaala rịrị ma kwupụta ogbugbu ndị ojiegbe otu ụkọchukwu ha n'abalị ụbọchị Tọzde 26 Disemba, 2024.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi onye chanselọ ụlọụka ahụ bụ Fada Raphael Ezeogu wepụtara n'akara soshal midia ha n'ụbọchị Fraịde 27 Disemba, 2024.

O kwuru na ndị ojiegbe wakporo ma gbagbuo Fada Tobias Chukwujekwu Okonkwo n'obodo Ihiala dị n'okporoụzọ si Onitsha gawa Owerri.

O gara n'ihu kwuo na mkpamkpa ahụ mere n'ihe dịka elekere asaa ruo elekere asatọ nke abalị.

Ozi si n'aka Chanselọ ụlọụka Katọlik nke Nnewi bụ Fada Raphael Ezeogu

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nnewi/Facebook

N'ozi ya "Ụka katọlik Nnewi Dayọsis ji anya mmiri na-ekwupụta ọnwụ ụkọchukwu anyị bụ Fada Tobias Chukwujekwu Okonkwo, onye ndị ojiegbe gbagburu n'Ihiala dị n'okporoụzọ si Onitsha gawa Owerri, n'ihe dịka elekere asaa ruo asatọ nke abalị Tọzde 26 Disemba, 2024.

"Anyị na-arịọ ka e kpeere ya ekpere ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa ka o nwee ike ṅụrịa n'ala Eze ruo ebighi egbi, ma na-eti ezinaụlọ ya aka n'obi."

Fada Ezeogu kwuru na oge na-adịghị anya , na ha ga-ekwupụta maka usoro olili na akwamozu Fada Okonkwo.

Onye bụ Fada Tobias Chukwujekwu a e gburu?

Ụkọchukwu Tobias Chukwujekwu Okonkwo bụ nwafọ obodo Ekwulumili dị n'okpuruọchịchị Nnewi South, Anambra Steeti.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nnewi/Facebook

  • Fada Tobias Chukwujekwu Okonkwo bụ Ụkọchukwu Katọlik nke Dayọsis Nnewi, Anambra Steeti.
  • Ọ bụkwa nwafọ obodo Ekwulumili dị n'okpuruọchịchị Nnewi South.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba ihe banyere nrụpụta ọgwụ a kpọrọ 'Pharmacy'.
  • Tupu ọnwụ ya, Fada Okonkwo bụ onye na-elekọta ụlọakwụkwọ ndị nọọsụ, ndị na-amụ nwa nakwa ụlọ nnyocha ahụ nke ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes dị n'Ihiala.