Ihe anyị ma maka Fabian Chinedu bụ onye nkuzi mahadum Unizik ndị ojiegbe gbagburu

Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University
Ndị ojiegbe a na-amabeghi ndị ha bụ gbagburu otu onye nkuzi na mahadum Nnamdi Azikikwe di n'Awka, Anambra Steetị na mgbede ụbọchị Mọnde 16 Disemba, 2024.
Ndị ojiegbe a wakporo Chinedu Fabian Osita n'ụgbọala ya n'ebe a ma ama ka 'Aroma Junction' dị n'Awka, gbagbuo ya.
O dobeghi anya ebe ndị a si na ihe mere ha jiri gbagbuo nwamadị a.
Ihe ndị uweojii na-eme gbasara ya
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kọwara ihe ndị uweojii na-eme ugbua gbasara etu e siri gbuo dọkịnta Chinedu Fabian Osita.
Tochukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o depụtara ebe ọ kọwara ihe mere ma zigara ezinaụlọ ndị e gburu nwa ha ozi itiaka n'obi.
N'akwụkwọ ozi ahụ "Isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambra steeti ebidola ime nnyocha maka otu nwoke bụ Fabian osita Chinedu a gbagburu".
"Ozi anyị na-enwete bụ na Fabian bụ onye nkuzi na-arụ ọrụ na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, Anambra steeti.
"Ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ gbagburu ya n'elekere iri nke abalị Monde 16 Disemba 2024 na mpaghara Aroma dị n'Awka
"Ndị gbagburu ya zukwaara ụgbọala ya".
"Ulọọrụ jiri ohere a na-arịọ ohanaeze bụ ndị hụrụ ihe mere maọbụ ndị nwere ihe ha maara ka gbaaraa ndị ọrụ nchekwa ama, nye aka chọpụta ndị gbagburu dọkịnta Fabian Osita Chinedu".
Onye bụ dọkịnta Chinedu Fabian Osita

Ebe foto si, Nnamdi Azikiwe University
- Dọkịnta Chinedu Fabian Osita bụ onye nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, Anambra steeti.
- Dọkịnta Chinedu n'ekuzi na ngaraba Business Administration department, Facualty of Management Sciences na mahadum Unizik.
- Dọkịta Chinedu wetera asambodo Dọkịnta philosophy n'afọ 2023.
- Chinedu gụrụ PhD Business Administration bido n'ọktoba 2019 ruo na Maay 2023.
- Ihe ọnụ na-ekwuru mahadum Unizik kwuru.
Ihe onye na-arụ ọrụ na mahadum Unizik kwuru
Mgbe BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru mahadum Unizik bụ Louis Okwudili Njelita, jụọ ya ajuju na ọ bụ eziokwu na a gbagburu otu onye nkuzi ha?
Ọsịsa Louis Okwudili nyere bụ na "ọ bụ eziokwu na dọkịnta Chinedu Fabian Osita e gburu bụ onye nkuzi na mahadum anyị".
Ọ gara n'ihu kọwaa na "ihe mere bụ eziokwu" ma kwuo na ihe niile ndị uweojii kwuru maka etu e siri gbagbuo Chinedu bụ eziokwu.
Louis gbakwụnyere na "ndị uweojii ekwuola na ha na-eme nyocha".
"Anambra agaghị abụ ebe nzuzo ndị na-ekperima n'Ọwụwa Anyanwụ"

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
Gọvanọ na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo tinyere ọnụ n'ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ nakwa mpagharaỌwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Gọvanọ Soludo bụ onye gwara ndị ntaakụkọ okwu n'obi gọọmenti sị na ọ bụ ndị ekperime na ndị nwere anya ukwu na-ebute ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.
Ọ sịrị na "ọtụtụ n'ime ndị omekome na-akpa ajọ ike na steeti ahụ bụ ndị zoro onwe ha n'otu dị iche iche kwuru na ha na-azọ nwereonwe Biafra ma were ya na-akpa mkpamkpa".
Soludo ji ohere ahụ were kwuo na ịtọhapụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnadi Kanu nwereike ọ gaghị akwụsị ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ.
O kwuru na ime ka ezi nchekwa dị bụ ọrụ aka mmadụ niile.
"O nwee ihe ị hụrụ, kwuputa ya. Anambra agaghị abụ ebe ndị omekome ga-eji mere ọdụ".








