Ihe Ada Ehi kwuru maka ịgba alụkwaghịm, otu ụzọ n'ụzọ iri na kọpịraịt

Aha onyonyo, Ihe Chineke kpọrọ asị bụ ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị ndị gbara alụkwaghịm - Ada Ehi
Ihe Ada Ehi kwuru maka ịgba alụkwaghịm, otu ụzọ n'ụzọ iri na kọpịraịt
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

Otiegwu a ma ama bụ Ada Ehi ekwuola na Chineke akpọghị ndị gbara alụkwaghịm asị kama ọ bụ alụkwaghịm n'onwe ya ka Chineke kpọrọ asị.

Ọ sịrị na ọ bụ eziokwu na akwụkwọ nsọ gwara ụmụnwaanyị ka ha nọrọ n'okpuru di ha mana o nyekwara ụmụnwoke iwu ka ha hụ nwunye ha n'anya dịka Kraịst siri hụ nzukọ ya.

Nke pụtara na ọ bụrụ na nwoke mee ihe niile o kwesịrị ime, enweghị nwaanyị na-agaghị eweda onwe ya n'okpuru di ya.

Dịka o siri kwuo "Ebe okwu dị abụghị nwaanyị iweda onwe ya n'okpuru di ya kama ka onye ọbụla rụọ ọrụ nke kwesịịrị ya, ka ihe niile gaa n'anya ya."

Gbasara ndị Ụkọchukwu a sị na-ekwusa oziọma otu ụzọ n'ụzọ iri, Ada Ehi kwuru na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ naanị oziọma otu ụzọ n'ụzọ iri ka ndị Ụkọchukwu na-ekwusa ugbua.

Ọ sịrị na oziọma na-ewu ebe niile ugbua bụ oziọma nke okwukwe mana ndị nwere atụmatụ ọjọọ na-ebugharị ozi ụgha na soshal midịa na-ekwu na ọ bụ naanị oziọma otu ụzọ n'ụzọ iri ka ndị Ụkọchukwu na-ekwusa ugbua.

Ada Ehi kọwakwara na otu ụzọ n'ụzọ iri abụghị ihe ga-eme ka mmadụ gaa eluigwe kama ọ bụ etu mmadụ si egosi ịhụnanya o nwere n'ebe Chineke nọ.

Ada Ehi gara n'ihu kwuo na mgbe ndị mmadụ ọkachasị ndị nhazi egwu ji okwu okwu kọpịraịt bụ mgbe egwu mmadụ malitere iwu ebe niile.

Dịka o siri kwuo, "ọ bụrụ na egwu gị enweghị onye ma ya, enweghị onye ga-atụpụrụ gị ọnụ mana ọ bụrụ egwu na-ewu ewu, ịchọpụta na ọ bụghị naanị gị dere ya, ọbụnadị ndị ịmaghị."

O nyere ndị na-eti egwu ndụmọdụ ka ha nwee ezigbo ihe akaebe oge ha na-etipụta egwu tupu onye amaghị onye ọ bụ apụta sị na ya so nwere egwu onye ahụ.

Lee ka Ada Ehi si malite iti egwu ụka

Aha onyonyo, Ada Ehi na-eti egwu ụka

Ada Ehi bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa nakwa n'Afrịka. Ọ bụ egwu ụka ka ọ na-eti.

Na mkparịtaụka a pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu o siri malite iti egwu n'agbanyeghị na ọ gụrụ ihe ọmụmụ njinịa na mahadum Lagos State University.

Ọ gwara anyị na ya bụ nwaafọ Okpuru ọchịchị Isiala Mbano dị n'Imo steeti mana di ya bụ Moses Ehi bụ onye Esan dị n'Edo steeti.

Ada Ehi kwuru na ya malitere iti egwu oge ọ nọ na mahadum site n'enyemaka enyi ya bụ Frank Edwards na-ahaziri ya egwu oge ahụ.

Dịka o siri kọwaa, egwu mbụ o tipụtara bụ 'Bobo Mi' mana nke mere ka ndị mmadụ mata ya nke ọma bụ nke ọ kpọrọ 'Only You Jesus'.

Ọ sịrị na enwebeghị mgbe ọ batara ya n'uche iti egwu agbantịrọ n'ihi na ọ bụ naanị ihe nke ụwa ka ndị na-eti ya na-agụkarị.

Ada Ehi kwuru na ọtụtụ egwu ya bụ ndị na-akpalite mmụọ n'ihi na ọtụtụ mmadụ bụ ndị na-agabiga ọnọdụ ọjọọ dị iche iche n'ụwa.

O kwukwara na ya amaghị na ya bụ onye a ma ama n'ihi na nke ahụ abụghị ebumnobi ya oge ọ malitere iti egwu.

O nyere ndị ntorobịa ndụmọdụ, ọkachasị ndị na-achọ ịmalite iti egwu ụka ka ha nwee ezi nlekwasa anya ma marakwa ihe ha na-eme.

Ọ gwara ha wezuga echiche ị bụ onye na-ewu ewu n'ihi na ọ bụghị n'ikikere nke mmadụ ị bụ onye a na-anụ aha ya n'ụwa dum.

Ada Ehi