Nne m maara agụ egwu m niile, ọ bụ ya kachasị akwado m - Jeriq

Aha onyonyo, Etu egwu mụ na Phyno gụrụ si gbanwee ndụ m - Jeriq
Nne m maara agụ egwu m niile, ọ bụ ya kachasị akwado m - Jeriq
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Otiegwu Chukwuebuka Ani onye e ji Jeriq mara, akọwaala etu njem egwu ya si malite.

Na mkparịtaụka ya na BBC News nwere, Jeriq kwuru na ọtụtụ ihe cheere ya aka mgba oge ọ na-amalite iti egwu.

Jeriq bụ onye Ihuokpara dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East, Enugwu steeti, mana a mụrụ ya na nkpor dị n'Onitsha Anambra Steeti
Nkọwa foto, Jeriq bụ onye Ihuokpara dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East, Enugwu steeti, mana a mụrụ ya na nkpor dị n'Onitsha Anambra Steeti

N'okwu ya 'Nna m kwuru na ọ bụ ajọ mmụọ ji m aka oge ọ chọpụtara na m na-eti egwu'.

Ọ gbara n'anwụ nke bụ eziokwu banyere etu o si zute Phyno nakwa etu Phyno si nyere ya aka ma na-akwado ya.