Nne m maara agụ egwu m niile, ọ bụ ya kachasị akwado m - Jeriq
Nne m maara agụ egwu m niile, ọ bụ ya kachasị akwado m - Jeriq
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Otiegwu Chukwuebuka Ani onye e ji Jeriq mara, akọwaala etu njem egwu ya si malite.
Na mkparịtaụka ya na BBC News nwere, Jeriq kwuru na ọtụtụ ihe cheere ya aka mgba oge ọ na-amalite iti egwu.

N'okwu ya 'Nna m kwuru na ọ bụ ajọ mmụọ ji m aka oge ọ chọpụtara na m na-eti egwu'.
Ọ gbara n'anwụ nke bụ eziokwu banyere etu o si zute Phyno nakwa etu Phyno si nyere ya aka ma na-akwado ya.



