Lee ihe jikọtara mụ na Sunshine Rosman - Bucci Franklin

Ebe foto si, Bucci Franklin/Instagram
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Buchi Franklin Odurukwe na-eme ejije a maara nke ọma dịka Bucci Franklin ekwuola na agwa o gosipụtara dịka "Oboz" n'ejije "To Kill a Monkey" bụ nke o ji zigara ndị ntoroọbịa ozi.
Bucci Franklin kwupụtara nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche na nso nso a.
Nwaamadị ahụ bụ onye aha ya na-ewu ebe niile ugbua n'ihi agwa onye akpụobi ọ kpara n'ejije "To Kill a Monkey".
O kwuru na ya malitere ime ejije oge ọ dị na nwata mana ọ bụ oge ọ gụchara ihe ọmụmụ Theatre Arts na mahadum University of Abuja ka ya malitere ime ejije nke ọma.
Ọ sịrị na mmasị ya nwere gbasara ime ejije bụ maka ozi ọ na-agbasa, tụmadị nke o mere dịka Oboz.
"Ọ bụ ya mere m jiri kpaa agwa ahụ ka ndị mmadụ ghọta na ọ bụ eziokwu na ngwọrị dị na ya mana ọ na-ebute ọnwụ n'ikpeazụ," ka Bucci Franklin kwuru.

Nwaamadị ahụ bụ onye Obinọcha dị n'okpuru ọchịchị Nkwerre n'Imo steeti, sịrị na o ruola afọ iri ọ malitere ime ejije, mana ọ bụ ugbua ka a malitere ịhụta ịgba ndị ọ na-eti site n'amara Chineke.
Ọ kọwara na agwa akpụobi o gosipụtara n'ejije "To Kill a Monkey" araghị ya ahụ n'ihi na ya ahụtụla ndị na-akpa ụdị agwa ahụ na mpaghara Surulere dị na Legọs steeti nakwa Pọtakọt isi obodo Riva steeti.
Gbasara akụkọ na-efegharị ebe niile na Bucci Franklin na otu nwaada na-eme ejije bụ Sunshine Rosman na-eme enyi, nwaamadị ahụ sịrị na ọ naghị amasị ya ikwupụta ihe ọbụla metụtara ya.
O kwuru na ya bụ otu n'ime ndị kachasị hụ ihe Sunshine Rosman na-eme n'anya ma bụrụkwa onye na-akwanyere nwaada ahụ ugwu nke ukwuu.
Ọ rịọrọ ndị niile ihe ya na-amasị ka ha gaa ebe dị iche iche a na-ekiri onyonyoo iji were anya ha hụ ejije ndị ọ na-eme ma sikwa etu ahụ gbaa ya ume ịga n'ihu na-emepụta ejije dị mma.

Ebe foto si, Bucci Franklin/Instagram



