'Ọ bụ ejije Cry for Help mere ka onye niile mara m' - Nkiru Sylvanus

Aha onyonyo, Ihe mere m ji banye na ndọrọndọrọ ọchịchị - Nkiru Sylvanus
'Ọ bụ ejije Cry for Help mere ka onye niile mara m' - Nkiru Sylvanus
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji, Ikechukwu Kalu, Kelechi Anozia na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Senior Journalist and Video Journalists

Omee ejije a ma ama bụ Nkiru Sylvanus, onye a maara nke ọma dịka 'Ble-Ble' akọwaala ka ya na ije si aga n'ihe gbasara ime ejije na igwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka, Sylvanus kọwara na ya malitere ime ejije oge ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị.

Ya bụ nwaada e ji ịkwa akwa mara n'ejije kwuru na ejije mbụ o mere bụ ejije ọdịnaala (epic movie) nke ya agaghị echetanwụ aha ya mana ọ kpara agwa n'ejije ahụ dịka nwa Ngozi Ezeonu.

"Ihe mere ha jiri kpọọ m maka ejije ahụ bụ n'ihi na ha na-achọ onye ga-akpa agwa nwa Ngozi Ezeonu, maka na ha sị mụ na ya yiri," ka ọ kọwara.

Dịka o siri kwuo, ejije mere ka onye niile mara ya na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ Cry For Help.

"Ọ bụ ejije Cry for Help mere ka ọtụtụ mmadụ chọpụta onyinye amara Chukwu nyere m, ụfọdụ asị na akaraaka m bụ ịkwa akwa," ka ọ gwara anyị.

Nkiru Sylvanus na-eme ejije

Ebe foto si, nkirusylvanus_real/Instagram

Nkiru Sylvanus kọorọ anyị na ike gwuru ya ịkwa akwa n'ejije nke mere o ji kwụsịtụ ime ejije ma nyetụ ohere. Ọ sị na ya jụkwara ịnabata ejije ọbụla ọ ga-akwa akwa n'ime ya.

Nwaafọ Abịa steeti ahụ mere ka anyị mata na ihe mere o jiri banye igwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ n'ihi mmasị o nwere ịgara ọhanaeze ozi.

Ọ sịrị: "Onye pụtara ịzọ ọchịchị oge ahụ [Rochas Okorocha] bụ onye m hụrụ na o nwere obi mmadụ maka na oge ahụ a na-ekwu okwu Rochas Foundation ebe niile, sị na ọ na-enye agumaakwụkwọ n'efu".

"Oge a kpọrọ m ka m soro gwuo ndọrọndọrọ ọchịchị, e sooro m ha iji mee ya ka ọ dị mma, ka ndị Imo [steeti] nwee ike rite uru ndị ha anabughị erite," ka ọ kọwara.

Oge a jụrụ ya ihe na-ebutekarị ịgba alụkwaghịm n'etiti ndị na-eme ejije, Nkiru Sylvanus sị na ọ bụ maka na ndị na-eme ejije anaghị elebara onwe ha anya iji chọpụta ma ọchịchọ ha na ndị ha chọrọ ịlụ ọ makọrọ tupu ha alụọ.

"Ụfọdụ na-alụ ka a sị na ha alụọla di, ụfọdụ na-alụ maka ego, ụfọdụ na-alụ maka mma, ụfọdụ na-alụ maka na ọ bụ onye a ma ama mana tupu ị mara ihe na-eme, ọ ghasaa," ka o kwuru.

O nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ chọpụta oge ha dị njikere ịlụ di maọbụ nwunye n'ihi na ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma.