Ụmụnwoke Igbo anaghị eji aka ike alụ ndị nwunye ha - Omoni Oboli

Aha onyonyo, Ụmụnwoke Igbo anaghị eji aka ike alụ ndị nwunye ha - Omoni Oboli
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji, Mobolaji Olatunde na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalists
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Omoni Oboli sịrị na ịmepụta ejije na-enye ya ohere ịgbazi ndị na-eme ejije.
Nkọwa foto, Omoni Oboli sịrị na ịmepụta ejije na-enye ya ohere ịgbazi ndị na-eme ejije.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ụmụnwoke Igbo ji aka ike alụ ndị nwunye ha nke mere ha ji enyochagharị njem ọbụla ndị nwunye ha zọpụrụ.

Mana oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka, aka ochie na-eme ejije bụ Omoni Oboli kọwara nke ahụ dịka ebubo.

Dịka nwaafọ Urhobo a lụrụ n'ala Igbo, Oboli kwuru na di ya bụ Maazị Nnamdi ejighị aka ike alụ ya.

"Di m ejighị aka ike alụ m. Ihe m nwereike ikwu bụ na ụmụnwoke Igbo na-ahụ ndị nwunye ha n'anya".

"Ụmụnwoke Igbo ma ka e si ahụ nwunye ha n’anya, ha ma ka e si elekọta ezinaụlọ ha na ndị nwunye ha nke ọma," ka Oboli kwuru.

Ụmụnwoke Igbo anaghị eji aka ike alụ ndị nwunye ha - Omoni Oboli

Ebe foto si, Omoni Oboli/Instagram

Nkọwa foto, Omoni Oboli na-eme ejije

Oge a jụrụ ya nke ọ kachasị hụ n'anya n'etiti ime ejije na imepụta ejije, Omoni Oboli sịrị "ime ejije na-amasị m nke ukwuu n’ihi na ọ bụ ebe m siri malite mana imepụta ejije na-atọ m ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-enye m ohere ime ka ihe e dere ede pụta ìhè".

Ọ sịrị na imepụta ejije na-enye ya ohere ịgbazi ndị na-eme ejije.

N'okwu ya, "ọ na-amasị m ịgbazi ndị na-eme ejije. Ọ na-amasị m ịhụ ihe m chọrọ. M gwa gị na ọ bụ ihe a ka m chọrọ, i mee ya ka ọ pụta etu ahụ o si dịrị m n’isi. Ọ bụrụ ma m na-atụzi aka gbasara akụkọ dị m n’isi, m na-ahụ ya ka ọ na-apụta ihe, e nweghị ihe dịka ya," ka o kwuru.

Gbasara ndị enyi ya ha na ya so eme ejije, Oboli sịrị na ihe mere ha ji bụrụ enyi kemgbe ọtụtụ afọ bụ maka na ha ghọtara onwe ha nke ọma.

Dịka o siri kwuo, ime enyi bụ ihe mmadụ kwesịrị ịghọta nke ọma, onye ọbụla kwesịrị ịghọta na ime enyi apụtaghị na agaghị enwe esemokwu.

"Ọ bụ ịghọta na ihụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Ọ pụtaghị na ndị enyi gị agaghị emejọ gị, ọ pụtaghị na ị gaghị emejọ ndị enyi gị," ka Oboli kwuru.

Na mgbakwunye, ọ sịrị na ọ bụ naanị ịhụnanya, nghọta, ntụkwasịobi na nnagide bụ ihe kachasị mkpa n'ụdị mmekọrịta ọbụla dị n'etiti mmadụ na ibe ya.