Nollywood enyela ụmụ Gen-Z ezigbo ohere igosipụta ọnatarachi ha - Chimezie Imo

Aha onyonyo, Nollywood enyela ụmụ Gen-Z ezigbo ohere igosipụta ọnatarachi ha - Chimezie Imo
Nollywood enyela ụmụ Gen-Z ezigbo ohere igosipụta ọnatarachi ha - Chimezie Imo
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist

Chimezie Imo bụ nwaokorobịa na-eme ejije Nollywood, onye ritere nkwanyeugwu 'trailblazer' n'oge emume Africa Magic Viewers' Choice Awards (AMVCA) nke afọ 2024.

Na mkparịtaụka a pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, Chimezie Imo kọwara na ya bụ nwaafọ Orsu dị n'Imo steeti mana nne na nna ya mụrụ ma zụọ ya na Kadụna steeti.

Imo kwuru na nne na nna ya chọburu ka ọ bụrụ Dọkịta mana oge ọ gwara ha na ọ bụ ime ejije na-amasị ya, ha nabatara mkpebi ya ma na-akwadokwa ya.

O kwuru na ejije mbụ o mere bụ 'Learning Curves' mana ejije ya kachasị amasị ya bụ 'Breath of Life' nke o ṅomiri agwa 'Elijah'.

Nollywood enyela ụmụ Gen-Z ezigbo ohere igosipụta ọnatarachi ha - Chimezie Imo
Nkọwa foto, Chimezie Imo na-eme ejije Nollywood

Chimezie Imo kọwara na Nollywood enyela ndị na-eto eto ezigbo ohere igosipụta akaraka na ọnatarachi ha.

Dịka o siri kwụọ "Nollywood na-agbalị. Ha na-edochi oghere dị n'etiti ndị okenye na ndị na-eto eto; ndị agba ochie na ndị Gen Z na millennials. Ha nwere akụkọ maka onye niile."

Imo kwuru na ya bụ onye na-enwe mmasị ịnọrọ onwe ya n'ihi na ọ na-eme ihere ịpụta n'ọgbọ mmadụ mana ọ banye ime ejije, ọ na-ewezuga ihere ma ṅomie agwa e nyere ya nke ọma.

Ọ gwara ndị ntorobịa nwere mmasị ime ejije ka ha gbaa mbọ hụ na ha na-eme ihe ọbụla ha na-eme nke ọma, ghara ile ihe ndị mmadụ na-ekwu ma zerekwa ihe mmegharịanya niile.