Nwaanyị Nnewi: Etu nne m ochie siri kpalite m ime ‘skit’
Nwaanyị Nnewi: Etu nne m ochie siri kpalite m ime ‘skit’

- Onye dere ya, Chinonso Ugorji na Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
Nwaanyị Nnewi bụ nwata nwaanyị na-eme nkenke ejije na-akpa ọchị a maara dịka ‘skit’ n’asụsụ Bekee.
Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na ebumnoobi ya bụ ime ndị mmadụ obiụtọ, nke ọ ga-abụ mgbe ọ bụla mmadụ gara n’ọbaozi soshal midịa ya, onye ahụ ga-achịrịrị ọchị.
Ọ kọwara na akparamaagwa ọ na-egosi n’ihe nkiri ya bụ nke nne ya ochie, onye o kwuru na-aba oke mba oge ọ bụla obi na-adịchaghị ya mma.
Nwaanyị Nnewi kwuru na ya enweghị mmasị isonye ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Nollywood ugbua mana ọ bụrụ na ya banye Nollywood, ọ bụ naanị agwa ntọọchị ka ọ ga na-egosi.
O nyere ụmụafọ Igbo ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ wulite ngalaba ime obiụtọ ma were ya kpọrọ ihe dị mkpa.
Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.






