Ihe mere n'ikpe EFCC na Cubana Chief Priest taa

Paschal Okechukwu a maara dịka Cubana Chief Priest na ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) amalitela inwe mkparịtaụka maka ụzọ a ga-esi dozie okwu banyere ebubo imetọ akwụkwọ ego Naịra ụlọọrụ ahụ boro ya.
N'ụbọchị Tọzde 2 Mee 2025, ọkaikpe Cubana bụ Chikaosolu Ojukwu gwara ụlọikpe na ha na-achọ ụzọ ọzọ ha na EFCC ga-esi dozie okwu ahụ.
Ka osiladị, onye ọkaikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụzie n'ụbọchị 5 Juun 2024 maka ileba anya n'ozi banyere ndozi okwu ahụ.
E boro Cubana Chief Priest ebubo imetọ akwụkwọ ego Naịra n'ụbọchị 16 Eprel 2024 mana ụlọikpe ukwu dị na Legọs nara ya n'ebe dịka o kwuchara na aka ya adịghị n'ebubo ahụ.
Cubana Chief-Priest : EFCC hapụrụ ndị ọchịchị na-ebu ego na-achụgharị ndị nkịtị na-abọ ego- Charly Boy

Ebe foto si, Area Fada/CubanaChiefpriest/Instagram
Onye otiegwu a ma ama bụ Charles Oputa a ma dịka 'Charly Boy' akatọọla ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) maka ịkpụpụ otu onye na-ewu ewu na Instagram a kpọrọ ,Paschal Okechukwu a ma dịka 'Cubana Chief Priest', ụlọikpe maka ebubo ịmetọ Naira.
Ụbọchị Wenezde, EFCC kpụpuru Cubana Chief Priest maka ebubo ịbọ ego na mmemme.
Mana Charly Boy katọrọ EFCC si na ha hapụrụ ụlọ na-agba ọkụ na-achụ ọke.
"Gịnị mere e ji tinye uchu na-achụgharị ndị mmadụ na-enweta onwe ha kama ịchụ ndị nọ n'ọchịchị na-ezu akata mkpo ego ọha na-eleghị anya n'azụ?"
Ọ gara n'ihu kwuo n'ịchụgharị ndị mmadụ maka ịbọ ego na-arụtụ aka na EFCC enweghị ọrụ dị mkpa ha na-arụ, karịa ị na-agba ọkọkọ iji mesaa ụmụ Naijiria agụ na-agụ anya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọikpe gwara Okechukwu jiri nde naịra iri gbapụta onwe ya dịka o kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo e boro ya.
Ịbọ Naira, ide ya ihe maọbụ tee ya atịtị megidere iwu naira.
"Ego bụ mmiri" – Ihe Cubana Chief Priest kwuru dịka ụlọikpe sị ya kwụọ N10m iji gbapụta onwe ya

Okechukwu Pascal e ji Cubana Chief Priest mara ekeleela ndị nkwado ya maka ozi na ịhụnanya ha gosiri mgbe ọ nọ n’aka ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC).
O depụtara nke a n’akara soshal midia ya dịka o si n’ụlọikpe pụta bụ ebe ọ gara ịzara ọnụ n’ebubo imetọ akwụkwọ ego naịra nke EFCC boro ya.
N’okwu ya “Ana m ahụ ozi ọma nakwa ịhụnanya unu, o wedara m ala. Ugbua o doola anya na CP abụghị nke obere.
“Ego bụ mmiri.”
Aka m dị ọcha n'ebubo imetọ akwụkwọ ego naịra - Cubana Chief Priest

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cubana Chiefpriest gwara ụlọikpe na aka ya dị ọcha n’ebubo imetọ akwụkwọ ego naịra e boro ya.
A kpụpụrụ nwamadị a n’ihu ọkaikpe Kehinde Ogundare nke ụlọikpe ukwu dị na Legọs n’ụbọchị Wenezde 17 Eprel 2024.
Ọ gwara ụlọikpe Ukwu dị na Legọs na aka ya dị ọcha n’ọnụ ebubo atọ ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) boro ya,
Dịka o kwuchara na aka ya dị ọcha, ụlọikpe nyere iwu ka a gbapụta ya n’ọnụ ego nde naịra iri (N10m), tinyere ndị akaebe abụọ ga-akwụkwa otu ọnụego ahụ.
Ndị akaebe a ga-abụkwa ndị ọrụ gọọmentị etiti nọ n’ogogo 16 gbagoo elu.
Cubana Chief Priest ga-enyefe akwụkwọ njem ya n’aka ụlọikpe a.
Ụlọikpe kwuru na ọ ga-emezu ihe ndị a n’ime ụbọchị asaa mana dịka ọ dị ugbua e nyefeela ya n’aka ndị ọkaiwu ya, bụ ndị ga-aṅụ iri ịkpọpụta ya n’ụlọikpe mgbe niile a chọrọ, ma ọ bụghị ya a tụọ ya nga.
Ụlọọrụ EFCC boro nwamadị a ebubo na o fere akwụkwọ ego naịra ọtụtụ ugboro n’emume ndị ọ gara na nso nso bụ nke ha kwuru megidere iwu na-achịkwa ụlọakụ etiti CBN nke afọ 2007.
Ebubo atọ e boro nwamadị a gụnyere

Ebe foto si, Ibrahim Mansur
- EFCC kwuru na Cubana Chiefpriest metọrọ ego mgbe ọ gara otu mmemme n'Eko Hotel n'ụbọchị 13 nke ọnwa Febụwarị site n’ife ego aghara aghara.
- Ọzọ bụkwa mgbe ọ na-agba egwu n'otu mmemme n'afọ 2020 na Legos.
- Nke ikpeazụ bụ na mmemme ọzọ e mere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2024 ebe ọ na-agba egwu ma na-efesasịkwa ego.
Nke a na-abịa n'ime ụbọchị ole ma ole ụlọikpe dị na Legọs tụrụ onye ọzọ a ma ama bụ Idris Olarenwaju Okuneye e ji Bobrisky mara mkpọrọ ọnwa isii n'ihi otu ebubo ịmetọ akwụkwọ ego naịra.
Nke a abụghị mbụ Cubana Chief Priest ga-ada n'aka ndị EFCC, n'ọnwa Maachị afọ 2022, ụlọọrụ EFCC nwuchiri nwamadị a n'ihi ebubo ibupu ego n'ụzọ na-ezighi ezi.
Ha mechara tọhapụ ya n'ọnwa Eprel dịka ọ nọchara ihe ruru otu izuụka n'aka EFCC ebe ha na-agba ya ajụjụ ọnụ.
Ihe i kwesịrị ịma maka Cubana Chief Priest

Ebe foto si, Cubana Chief Priest
- A ma ya dịka onye na-eme ihe ego ma na-egosikwa na o ji 'nkụ' I ji maa atụ, o nyere enyi ya nwoke bụ Obinna Iyiegbu (Obi Cubana) ehi 46 oge ọ kwara nne ya n'afọ 2021.Akụkọ kwuru na o nwere ụgbọala ndị oke ọnụahịa dịka: Rolls Royce Phantom, Toyota Prado, Mercedes Benz G-class na Range Rover.
- Cubana Chief Priest na-egosikwa akụnaụba ya nke ukwuu na soshal midia.
- Ọ bụ onye Umuhu Okabia dị n'Okpuru Ọchịchị Orsu n'Imo steeti
- O toro n'Aba, Abia steeti
- Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị elu, "Federal Polytechnic Nekede'.
- O bidoro ndụ ya dịka onye na-arụ akpụkpọụkwụ na otiegwu mana ọ chakeghị rue oge ọ banyere n'ọrụ otimkpu na onye na-ahazị ụlọnkwarị ndị nwere agba
- Ọ malitere ịhazi ụlọọrụ nkwarị nke Cubana Group.
- O mechara malite ụlọrụ nkwarị nke ya ọ kpọrọ "Club Xhrine n'afọ 2020.
- Ọ lụọla nwaanyị ma jiri ụmụ nwoke abụọ.








