Ihe asatọ nwereike ịme ka nwaanyị ghara iru n'isi mmiri n'oge mmekọ

Nwwanyị a na-ahịa aka n'ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Galván kwuru na ahụ nwaanyị kwesiri ịda jụụ na mmekọrịta

Akụkọ a nwere okwu gbasara aramara naanị okenye kwesiri ịgụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị sayensị, ndị dọkịta nakwa ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị achọpụtabeghị ihe mere ụmụnwaanyị ejighi erucha njedebe na mmekọ.

E deela ọtụtụ ihe gbasara ya bụ erughi njedebe mmekọ n'ụmụnwaanyị.

N'agbanyeghi nke a, ọbụghhị ụmụnwaanyị niile na-eru njedebe. Ụfọdụ ejirila ọnụ ha kwuo na ha anaghị erute ebe ahụ.

BBC enyochala ihe mere ụmụnwaanyị anaghị eru njedebe a. Lee ihe ha chọpụtara.

Ihe ọjọọ meburu nwaanyị n'oge gara aga

Nwaanyị na-ezo ihu ya

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụru na nwaanyị agabigaala nsogbu ukwu, o nwereike ịmetụ aramara na mmekọ ya na nwoke.

Héctor Galván bụ otu onyeisi n'ụlọ nyocha ụbụrụ na aramara gwara BBC sị "nwaanyị ahụ nwere ọrụ o kwesiri ịrụ. Ọ dị mkpa maka ihe ọ gabigara nwereike ime ka ihere na-eme ya".

"Ọ dịịrị ya mkpa ịkọrọ onye ya na ya na-emekọ ihe mana o nwere ikike ị kọrọ ya naanị ihe ọ chọrọ ịkọrọ ya" ka o kwukwara.

Ị nwe ụfụ na mmekọrịta

Nwaanyị nọ na nsọ

Ebe foto si, Getty Images

Galván kpọrọ ọrịa 'dyspareunia' aha dịka ọrịa na-eme ka nwaanyị ghara iru njedebe mmekọ.

Ọ kọwara ya dịka ụfụ na-acha ọkụ tupu e mee mmekọ ma emechakwaa mmekọ.

Ọ sị "ọ bụrụ na ụbụrụ mmadụ jikọọ ụfụ na mmekọ, ọ ga-eme ka ọ na-agbara mmekọ ọsọ" ka ọ kọwara.

Nwoke na nwaanyi na-emeko

Ebe foto si, Getty Images

E nweghi ndidi na ịme ngwangwa

Otu n'ime ihe kachasị eme ka nwaanyị ghara iru njedebe na mmekọ dịka Galván si kwuo bụ inwe nchekasị na nsogbu n'ime uche ya.

"Ọ dị mkpa ka ahụ nwaanyị daa jụụ iji ru njedebe" ka o kwuru.

Nchekasị nwereike isi na ịrụ ọrụ, ịlekọta ezinaụlọ, ịlekọta ụmụaka, nzụkọ na ihe ndị ọzọ.

Nke a na-eme ka ụfọdụ ụmụnwaanyị ghọọ aghụghọ na ha eruola njedebe n'ihi achọghị imebi mmụọ onye nke ha.

Ọ dụrụ ndụmọdụ ka ụmụnwaanyị kwuputa ihe ndị na-echekasị ha ka amara ihe a ga-eme ya.

Ị gbachi nkịtị

Ịgbachi nkịtị anaghị eneyre ụmụnwaanyị aka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịgbachi nkịtị anaghị eneyre ụmụnwaanyị aka

Ọ dị mkpa ịghọta na abịa na mmekọ nwoke na nwaanyị, o nweghi onye nwere ike ịma ihe ibe ya na-eche.

Ha nwereike ile anya etu i si eme omume mana o nweghi ihe karịrị imepe ọnụ gị kwuo okwu.

Dọkịta gwara BBC na "ọ na-ara ndị mmadụ ahụ ịgwa onye ha na ya na-eme mmekọ etu ha si chọọ ya".

Nke a mere Galván ji kwuo na ikwuputa uche gị na inwe mkparịtaụka dị mkpa tupu e nwee mmekọ, mgbe a n-enwe mmekọ nakwa enwechaa mmekọ.

"Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agwa anyị na onye nke ha anaghị enye ha ohere iji ru njedebe aramara" ka o kwuru.

Akpaliteghi ahụ nwaanyị ọfụma

Ahụ nwaanyị

Ebe foto si, iStock

Nkọwa foto, Ịgosi onye nke gị ụzọ n'oge aramara nwereike inye unu abụọ aka ịghọta ahu unu.

Nsogbu nke a gbadoro ụkwụ na mmadụ ịgwa onye nke ya ihe ọ chọrọ na ihe masịrị ahụ ya.

Ịkpalite ahụ nwaanyị dị mkpa ime ka ọ gbaa mmiri tupu amalite aramara.

Ọ bụkwa ụzọ iji hụ na ụfụ belatara na ngwụcha mmekọ.

"Ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-abịa akọrọ anyị na ụmụ nwoke amaghị akpalite mkpụrụ ọtụ ha nakwa na ụfọdụ oge ọ na-ebute ụfụ mana ịjụọ ha, ha asị gị na ha agwabeghi nke nwoke maka ụjọ imerụ mmụọ ya".

E nweghi ọchịchọ mmekọ

Nne na nwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọmụmụ nwa so n'ihe ndị na-ebuda ọchịchọ mmekọ n'ahụ nwaanyị

Ngalaba ahụike mba Briten bụ NHS kwuru na enweghi ọchịchọ mmekọ na-emetụta ụmụ nwaanyị afọ niile.

Ọ kachasị n'idi ime, amụchaa nwa, ịnọ na nsogbu.

Obi ida mba, ịṅụ ụfọdụ ọgwụ nakwa mgbanwe 'hormone' n'ahụ mmadụ nwereike iso gbuo ọchịchọ mmekọ n'ahụ nwaanyị.

NHS gosikwara na ọchịchọ nwerweike ikuli maọbụrụ na ihe akpọrọ 'testosterone' dị n'ahụ nwaanyị datuo.

Ha kwuru na ọ dị mkpa ịgaa ụlọọgwụ chọpụta ihe bu nsogbu n'ezie.

'Eze onye agwa na m'

Dọkịta ahụ gwara BBC na ụdịrị ụmụnwaanyị enweghi ike iru njedebe site na nyocha ha bụ ụmụnwaanyị dị isi ike.

Ụfọdụ n'ime ha na-achọ ime uche ha mgbe niile, na-acho ka ihe gaara ha ụzọ ha nke ọma.

"Ụdịrị nwaanyị a ga na-ele onwe ya n'ahụ ya na mmekọ nke ga-eme ka uche ya pụọ n'ihe a na-eme dịka ọ ga na-ele onwe ya anya" ka o kwuru.

N'ụdịrị ọnọdụ a, ọ dị mkpa ka nwaanyị daa jụụ, chefuo nsogbu ma hapụ ahụ ya aka.

Nsogbu zoro ezo

Nsogbu ikpeazụ nke ọkachamara rụtụrụ aka bụ ọyị nwoke na nwaanyị.

"Ụfọdụ mgbe, nwoke na nwaanyị nwere nsogbu mmekọ bịa mee nyocha n'aka anyị, anyị na-achọpụta na he nwere nsogbu zoro ezo n'etiti ha abụọ.

Anyị na-adụ ha ndụmọdụ ha chọpụta ihe ọ bụ ma dozie ya bụ nsogbu na-emetụ aramara nakwa ebe ọzọ na ndụ ha.