Agaara m ewepụ obi n’agụmaakwụkwọ n’ihi ego – Nwaakwụkwọ bụ ọkaibe na UNILAG

Aha onyonyo, Agaara m ewepụ obi n’agụmaakwụkwọ n’ihi ego – Nwaakwụkwọ bụ ọkaibe na UNILAG
Agaara m ewepụ obi n’agụmaakwụkwọ n’ihi ego – Nwaakwụkwọ bụ ọkaibe na UNILAG
Benedict Umeozor yi efe ngwụcha akwụkwọ Mahadum Legọs

Ebe foto si, Benedict Umeozor

Nkọwa foto, Agaara m ewepụ obi n’agụmaakwụkwọ n’ihi ego – Nwaakwụkwọ bụ ọkaibe na UNILAG

Benedict Chukwuzubelu Umeozor bụ nwata gụrụ akwụkwọ na mahadum University of Lagos (Unilag)

Ọ bụ nwataakwụkwọ tuuru ugo dịka ọkaibe nke bekee kpọrọ 'Overall Best Student' na klassị nke afọ 2025 n'ụlọakwụkwọ Unilag.

Na mkparịtaụka pụrụ iche nke Benedict na BBC News Igbo nwere, ka o kwuru na ọ bụ mmadụ ịmara onwe ya, nkwụdosi ike n'ihe ọ na-eme na mkpali mmụọ mere o jiri ruo ebe ọ nọ taa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ebumnobi ya mgbe ọ banyere ụlọakwụkwọ mahadum bụ inweta akara nzere 'first class' mana Chineke buliri ya elu karịa ihe o chere.

Ọ kọwara banyere otu ya si na-agụ akwụkwọ, na-arụ ọrụ nakwa akuziri klaasị ndị ntoroọbịa ndị ọzọ ihe na mahadum.

Dịka o siri kwuo; "Ndị mmadụ ga-eche na m ga-aga mahadum mgbe m dechara ule WAEC mana ọ bụghị otu ahụ ka ọ dịịrị m n'ihi enweghị ego iji dee ule JAMB n'oge ahụ."

"Ya mere, agara m nọnyere otu n'ime ụmụnne nna m nwoke na-azụahịa n'ahịa Balogun dị na Legọs. Ebe ahụ ka m mụtara ihe gbasara azụmaahịa na ịzụ na ire."

"Ọ fọrọ ntakịrị ka m ghara ịgụakwụkwọ mahadum n'ihi na ahụrụ m nnukwu ego n'ebe ahụ. Mana m gaghachiri ịgụakwụkwọ n'ihi na ọ bụ ihe ndị mụrụ m chọrọ ka anyị mee," ka o kwuru.