Ihe ikpeazụ Ifunanya gwara anyị - Nne na nna ya

Aha onyonyo, Ifunanya Nwangene: Ihe ikpeazụ Ifunanya gwara anyị - Nne na nna ya
Ihe ikpeazụ Ifunanya gwara anyị - Nne na nna ya

Nne na nna Ifunanya Nwangene ekwuola ihe ikpeazụ nwa ha gwara ha tupu ọ nwụọ n'ụbọchị Satọde 31 Jenụwarị, 2026.

"Ọ gwara na agwọ ahụ tara dịka ọ na-ehi ụra n'ụlọ ya dị n'Abuja mana ọ gawara n'ụlọọgwụ iji nweta nleta".

Mazi Nwangene kọwara na ụlọọgwụ mbụ Ifunanya gara enweghị ọgwụ anti-venom.

"Ụlọọgwụ Federal Medical Center (FMC) dị n'Abuja bụ ụlọọgwụ nke abụọ ọ gara, ha gwara ya na ha nwere ọgwụ anti-venom".

Ọ gara n'ihu kọwaa na ya amaghị ihe mere ndị ụlọọgwụ FMC ji gwa Ifunanya kepụ ihe o kere n'aka ya iji gbochie nsị agwọ ahụ ịgazu ya ahụ.

“Ifunanya nwa m gwara na ndị ụlọọgwụ ahụ gwara kepụ ihe o kere n’aka ya maka na ọ bụ usoro ochie e ji eme ihe onye agwọ tara, ma tinyere ya drip”. - Nna ya

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Instagram

"Ifunanya nwa m gwara na ndị ụlọọgwụ ahụ gwara kepụ ihe o kere n'aka ya maka na ọ bụ usoro ochie e ji eme ihe onye agwọ tara, ma tinyere ya drip".

"Ọ bụ dịka ha tinyere ya drip ahụ ka nwa m malitere ịgwa m na o nweghị ike iku ume nke ọma, oge adịghị anya, nwa nwaanyị Ifunanya Nwangene nwụrụ".

"Okwu ikpeazụ ọ gwara m bụ "Papa, enweghị m ike iku ume nke ọma".

Nne ya bụ Patricia Nwangene, kọwara Ifunanya dịka nwa na-atụ egwu Chineke.

"Ifunanya nwa m bụ nwa Chukwu nyere onyinye ịgụ egwu, o nwere ifụnanya ebe mmadụ ibe ya nọ, ọ na-atụ egwu Chineke ma bụrụkwa nwa nwere nrubeisi".

Patricia Nwangene kwuru na oge pụrụiche ya agahị echefu bụ oge Ifunanya kpọkọrọ ndị otu egwu ya iji tiere ya egwu n'oge emume ụka nne afọ 2025.

O kwuru na ozi ikpeazụ Ifunanya zitere ya bụ na 28 Jenụwarị, 2026.

"O zitere m ozi na e nwere ihe na-echu ya ụra n'ụbọchị ahụ".

"Agwara m ya na Chukwu abụghị Chukwu na-enweta mgbagwoju anya, kpọkuo onye n'oge ihe mgbagwoju anya maka na ọ ga-ezitere gị ndị mmụọ ozi ya ka ha nyere gị aka"

"Ọ bụ ya bụ ozi ikpeazụ mụ na ya nwere."