Ihe anyị ma maka ‘nwa bọị’ a sị ji aka ọdụ kụgbuo nna ya ukwu n’Anambra

Chima bụ onye ọrụ tekịnụzụ na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka

Ebe foto si, Chima Anolue/Facebook

Ihe na-efegharị ugbua na soshal midia bụ akụkọ ebubo etu otu nwata nwoke bụ onye odibo siri gbuo nna ya ukwu ka bụ nwaokoroọbịa.

Ndị uweojii Anambra steeti ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya. BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga, ọ zaghị ekwentị ya.

Akụkọ kwuru na nke a mere n’ababị Fraịde 14 Julaị, 2023 n’obodo Ifite dị n’Awka nke Anambra steeti.

Etu o si mee

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka nwa odibo a ji ọnụ ya kwupụta etu esemokwu jiri dapụta n’etiti ya na nna ya ukwu bụ Chima Anolue nke mere o jiri were aka ọdụ kugbuo ya.

O kwuru “mgbe nna m ukwu lọtara n’abalị, ọ gwara m gaa sie osikapa. Anọ m na-esi osikapa ahụ, ọ jụọ m ihe mere na asaghị m efere ndị ruru unyi n’ụlọ mana a gbara m ya nkịtị ugboro ugboro.

“Nke a mere o jiri maa m ụra na nti, m gwara ya amazila m ụra ahụ na ntị na-enye m nsogbu mana ọ mara ụra ọzọ ma were ụtalị na-apịa m, nke mere anyị jiri malite ịlụ ọgụ.

“Ọ bụ dịka anyị na-alụ ọgụ ka m jiri were aka ọdụ kụọ ya n’isi ya daa n’ala.

Nwa odibo a gara n’ihu kwuo na ọ kụrụ nna ya ukwu Chima aka ọdụ ahụ ihe ruru ugboro atọ tupu ọ daa n’ala ọbara eju ebe niile.

Ihe onyonyo ọzọ gosikwara ka ozu Chima tọgbọ n’elu akwa dị n’ụlọọgwụ, ebe ndị ezinaụlọ ya na ndị enyi ya na-ebe akwa.

'Chima bụ onyeisi ndị ọbụ abụ n'ụlọụka'

Otu onye maara Chima nke ọma gwara BBC Igbo na ọ bụ ezigbo nwokoroọbịa a maara nke ọma na-efe ofufe n’ụlọụka St. Michaels and All Angel’s Anglican dị n’Awka.

O kwuru na Chima bụ onyeisi ndị ọbụ abụ n’ụlọụka ahụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na Chima bụ onye ọrụ tekịnụzụ na ngalaba ọmụmụ ihe ‘psychology’ na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka.