Abia Baby Factory: "Mama ukwu anyị sị na ọ na-ekunye gọọmentị ụmaụaka anyị na-amụ"

Ebe foto si, screen shot
Ndịagha Naịjirịa nke ngalaba 145 Battalion Umuahia, nke dị n'okpuru ndị otu 14 Brigade Ohafia, Abia Steeti, achọpụtala ụlọ enyemaka adigboroja ebe e debere ụmụagbọghọ dị ime, ọnụọgụgụ ha ruru 21.
Ha mere nchọpụta a taa bụ Sọnde, ụbọchị anọ nke ọnwa Jun 2023, n'obodo Umunkpeyi dị n'Isiala Ngwa, Abia Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha 14 Brigade bụ Prince Innocent Omale kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu.
O kwuru na onye nwe ụlọ ebe e debere ụmụagbọghọ ahụ bụ nwaanyị aha ya bụ Nma Achumba, mana ọ nọghị ya oge ndị agha bịara, kama ha jidere otu nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Katherine Oyechi Ngwanma, bụ onye na-esiri ụmụ nwaanyị ahụ nri.
"Ndị agha zọpụtara ụmụ agbọghọ 22 dị ime ebe ahụ ma zọpụtakwa ụmụaka abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị," Omale kwuru.
"Ndị agha wakporo ụlọ ahụ bụ nke onye nwe ya ji aghọgbu ndị mmadụ ma na-ekwu na ọ bụ ebe enyemaka maka ndị na-enweghị nne na nna, dịka ọ kpọrọ ya 'Nma Charity Home', bụkwa nke o denyere aha ya na ngalaba gọọmentị Abia steeti na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị."

"Anyị nwetara ịgba ama na onye nwe ụlọ a na-ere ụmụ ntakịrị ahụ ere, na-eresi ha ndị na-atụ mgbere ahịa nakwa ndị na-achụ aja ọjọọ."
Omale kwuru na ha enyefeela ụmụ agbọghọ ndị ahụ dị ime nakwa ụmụaka abụọ ahụ n'aka gọọmentị Abia Steeti.
Onye na-esiri ndị a nri bụ Katherine Oyechi Ngwanma, kwuru na o bighi ebe ahụ kama na ọ bịa sichaa nri, ọ lawa.
Ọ gara n'ihu kwuo na nwaanyị nwe ogige ahụ sị na ọ bụ gọọmentị ka ọ na-ekunye ụmụaka a mụrụ n'ogige ahụ ka e lekọta ha anya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ maghị ebe nne ha ukwu nwe ogige a bi kama na ọ na-ehi n'ogige ahụ oge ụfọdụ.
Ihe ndị obodo Umunkpeyi kwuru gbasara nke a

Onyeisi obodo Umunkpeyi bụ Orih Jude kwuru na ha ewegala mkpesa ugboro ugboro n'aka gọọmentị gbasara ụlọ ebe ahụ a na-edebe ụmụ agbọghọ.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa abịakwala n'ebe ahụ ụfọdụ oge ma zọpụta ụmụ agbọghọ dị ime n'oge gara aga.
"Oge ikpeazụ ndịọrụ nchekwa bịara ebe a bụ n'afọ 2019, oge Rabiu Ladodo bụ Kọmịshọna ndị uweojii Abia steeti," Orih Jude kwuru.
"N'oge ahụ ha zọpụtara ụmụ agbọghọ 14 dị ime nakwa ụmụ ntakịrị anọ, mana nwaanyị nwe ebe ahụ bụ oriakụ Achumba gbara ọsọ, mechaa lọghachite bidokwa ihe ọ na-eme."
Ihe gọọmentị Abia Steeti kwuru
Onyentaakụkọ anyị kpọtụụrụ Mazi Ferdinand Ekeoma bụ onye enyemaka mgbasaozi nke Gọvanọ Alex Otti nke Abia Steeti, o wee kwuo n'ezie na ụmụ agbọghọ ndị ahụ dị ime nọ n'aka gọọmentị ugbua.
O kwuru na otu n'ime ụmụ agbọghọ ahụ, aha ya bụ nwaada Godwin, malitere inwe ihe mgbu gosiri na ime na-eme ya, "mana anyị akpọgala ya n'ụlọọgwụ dị n'Amachara, ebe ndị nke ọzọ nọ n'ụlọọgwụ 'Demonstration Clinic/Hospital' dị n'Olokoro ebe a na-eleta ha anya.

Akụkọ gbasara ụlọ ebe a na-edebe ụmụ agbọghọ maka ịmụ nwa, nke a na-akpọ 'baby factory' na bekee, apụtala ugboro ugboro na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndịda Anyanwụ Naịjirịa.
N'ọnwa Sepụtemba 2019, ndị uweojii Legọs kwuru na ha zọpụtara ụmụ agbọghọ 19 dị ime n'otu ụlọ ebe e debere ha na-eche ka ha mụọ nwa ka e ree ụmụ ha.
Ndị uweojii kwuru na ndị ekperima a na-ere otu nwa nwoke ihe ruru $1,400 ebe nwa nwaanyị bụ $800.














