Etu nwagbọghọ na nne ya siri gbuo nwaọhụrụ ya,lie na nzuzo n'Enugu steeti

Ebe foto si, Enugu State Police
Ndị uweojii Enugwu Steeti ekwuola na ha na-enyocha ka ha chọpụta nke bụ eziokwu n'ebubo na otu nwaagbọghọ dị afọ 18 na nne ya gbara afọ 60 gbakọrọ aka gbuo nwa ọhụrụ ya iji kpuchie na ọ mụrụ ya site n'ime mkpuke.
Ada Joy Okonkwo na Christiana Okonkwo gbara afọ 60 gburu nwaọhụrụ ya ngwangwa a mụpụtara ya n'obodo Olocha-Adogba dị n'Okpuru Ọchịchị Ọgwụ n'abalị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Nọvemba afọ 2022.
Akụkọ boro ebubo na nne na nwa ahụ liri nwatakịrị ahụ na nzuzo n'azụ ụlọ ha.
Nke a kpalitere ụmụnwaanyị obodo ime ngaghariiwe dịka ha hụrụ nwata nwagbọghọ a ma dibu ime ọmụmụ mana ha ahụghịkwa nwa, nke ọ na-enye ezi nkọwa ebe nwaọhụrụ ahụ nọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ Daniel Ndukwe, onye gbara ama na akụkọ na nwaanyị na nwa ya gburu nwa ọhụrụ bụ eziokwu, kwuru na ndị uweojii ebugara ozu nwata ahụ ụlọọgwụ ebe ndị ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla.
Ọ sịrị, " Nwa nchọpụta anyị merela gosiri na nwaanyị ji mma ekwu were sugbuo nwaọhụrụ ahụ dịka nne ya si dụọ ya ọdụ ngwa ngwa ọ mụchara yan'ụlọ."
" E bugara nwa ọhụụ ahụ ụlọọgwụ, ebe ndị dọkịta nọ ọrụ kwuru na ọnwụọla, etinyeya n'ụlọozu. maka nchekwa na nnyocha ihe gburu ya."
Akụkọ ka na-abịa











