Etu e si nwụchi ụmụnwoke atọ a sị dinara nwata dị afọ 13 n’ike n’Anambra

Ndị ntorobịa

Ebe foto si, Naptip

Aka akparala ụmụ okorobịa atọ e boro ebubo na ha dịnara nwta nwaanyị dị afọ 13 n’ike n’Anambra steeti.

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ na-egbochi ntọrọ nakwa orure ndị mmadụ na Naịjiria bụ National Agency For Prohibition of Trafficking in Persons (Naptip) gwara BBC Igbo n’ụbọchị Tọọzde na ha kpara nkata nwụchịe ụmụnwoke atọ n’ime anọ a na-enyo dịnara nwata nwaanyị dị naanị afo 13 n’ike na Nkpor nke okpuruọchịchị Idemmili Nọt, N’Anambra steeti.

Mmadụ atọ a kwụpụtara dịka ndị uweojii nọ na-agba ha ajụjụ ọnụ na ha mere ihe a maka esemokwu ha na nna nwata a nwere.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Kọmishịona ụmụnwaanyị n'Anambra bụ Ify Obinabo na nwata e dịnara n'ike.

Ebe foto si, Naptip

Nkọwa foto, Kọmishịona ụmụnwaanyị n'Anambra bụ Ify Obinabo na nwata e dịnara n'ike.

O kwuru “Anyị na ndị nche obodo rụkọrọ ọrụ ma wakpo be ndị a n’ Enekwesumpu Nkpor dịka anyị natara ozi n’aka nwatakarị a”

Nwatakarị a onye a kpọtara n’ụlọọrụ Kọmịshọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịnma ha bụ Ify. Obinabo, ji akwa arịrị na-akọ ihe ọ sị ọ gabigara n’aka mmadụ anọ a.

E kwuru na otu onye n’ime mmadụ anọ a gbara ọsọ mgbe ndị uweojii ọrụ nchekwa wụchiri ebe ahụ.

Dịka nwata ahụ si kọwa ‘Ụmụnwoke anọ dụgara n’akụkụ mmiri Nkisi ma dịnaa m n’ike ebe ahụ”

Dịka nkọwa sị n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịnma ụmụnwaayị n’Anambra siri kwuo, nwata ahụ kwukwara na ha mara ya ezigbo aka ntị tupu ha a kpọrọ ya n’ike gaa akụkụ mmiri ahụ.

O kwuru ‘Ha nyere m iwu n’ike ka m yipụ uwe m dịka ha malitere ịdịna m n’ike ma malite ime onye mechaa ọ rịtuoro nwanne ya.”

Otu onye n'ime ha atọ kwuru na o sighị dịnaa nwata ahụ mana ọ nọ ebe ahụ gbaa nkiri ihe mere mana nwata nwaanyị kwụru hoo ha na ya bụ nwaokorobịa so dịnaa ya n'ike.

Abụọ n'ime ha kwupụtara na ha dịnara ya bụ nwata n'ike.

Obinabo tọrọ nwata a maka ịka obi kwupụta ihe mere ya ma zitere ha ozi.

O jikwa ohere ahụ katọọ ihe a mere ma kwuo na ọ bụ ihe mwute jọgbụrụ onwe ya na akụkọ ndịna ụmụnwaanyị n’ike amalite iri elu na steeti ahụ.

Ọ dọkwara ọha aka na ntị kwuo “Ọchịchị anyị agaghị anabata agwa dị etu a ma ncha.”

Ụlọọrụ Naptip gwakwara BBC Igbo na ha enyefela mmadụ atọ a n'aka ndị uweojii dịka a na-agba mbọ ịnwụchi onye nke anọ.

Ha kwukwara na a ga-agba mmadụ atọ a akwụkwọ ngwa ngwa n'ụlọikpe n'oge na-adịghị anya.