Isha Sesay: Amaghị m na m ga-adị ime n'afọ 46 n'enweghị di

Onye ntaakụkọ a ma ama n'ụwa ma bụrụ onye bụbu onye ntaakụkọ CNN bụ Isha Sesay akọwapụtala etu o si tụrụ ime n'afọ 46 , na-alụghị di.
Sesay , nwa afọ Sieera Leone toor na mba Briten kọọrọ ụlọntaakụkọ Today.com akụkọ ije ya na nsonso a.
O kwuru na ọ bụrụ na afa gbara ya oge ya dị afọ 16 na ya ga-eru afọ 46 na-enweghị di, ma tụọ ime, na ya agaghị ekweta.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru na ya haziri ndụ ya chee na ọ bụ etu ya si chee ya ka ọ ga-esi adị mana dịka afọ na-amanye , nwada ahụ lụrụ di nwa mgbe nta mana ọ badaghị kọwara na ya kpebiri ịtụrụ ime oge ya hụrụ na oge na-agbalahụ ya.
"Alụmdi nwa oge mụ na otu nwoke obiọma amịtaghị mkpụrụ, na-afọ mgbara afọ 40, nne m dara n'ọrịa mkpọnwụ ahụ nke enyeghị m ohere ime ihe ọbụla karịa ilekọta ya. Afọ isii gafere m we hụ onwe ka mụ na nwoke ọ na-ewe awa 12 iji saa m ozi zigara ya n'ekwe ntị na ihe mgbama ọjọọ ndị ọzọ."
"Ka anyị gbasara ka o doro m anya na : na amụghị nwaa ga-abụ ihe m ga-aka tacha onwe mụ ụta na ndụ m."
Sesay abụghị obere mmadụ. Ọ rụrụ ọrụ na CNN afọ 13, gaa nje ọrụ na mba dị iche iche n'ụwa ma mee ọtụtụ ndị ndụ na mba ụwa ajụjụ ọnụ.
O deela otu akwụkwọ ma bụrụkwa onye nwere hiwere otu abụghị nke gọọmentị na-enyere ụmụaka ụmụnwaanyị aka.
Mana ị bụ nne bụ ihe kachasị agụ ya agụụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Asị m chewa nwoke dị mma ka ọ bịara m di tupu ma amụọ nwaa, o nwere ike oge agbalahụ m. Ya mere ji kpebie iji ụtụtụ chọwa ewu oji site ikpebie ime ihe kachasị atụ egwu n'ụwa: ịmụ nwa n'onwe m. "
"Ekweghị ka ihe ụwa ga-ekwu napụ ime ihe bụ uche m."
Sesay gbasoro ụzọ IVF were chọta ihe dị ya mkpa mana ọ dịghị ya mfe.
"Kwa mgbe nzukọ mụ na ndị dọkịta, nnyocha ọbara,nyọcha ahụ, ọgwụ na-ahụ agbọọ, na ịwa ahụ maka 'fibroid ma amaghị na ọdị ya so na ịchọta onye a ga-eji uhe ya(sperm donor) so na nsogbu m gabigara."
" IVF nke mbụ mere amịtaghị mkpụrụ, Ebere m akwa ọtụtụ ụbọchị tụppụ nweta ike mekwa ọzọ ka ọnwa ole na ole gachara."
"Dọkịta m bere ije nke abụọ ahụ nkenke ka ọ hụrụ na ahụ m anabataghị ọgwụ ọ na-enye m."
" Nke atọ ya bụ nke m enweghị olileanya rinne bụ nke nọdoro ."
O kwuru na ya tiwapụrụ akwa oge nnyocha gosiri na ya adịla ime.
Sesay gara n'ihu kwuo na obi na-atọ ya rịkọọ na agbanyeghị ike ọkwụkwụ, agbọ ọhụhụ, enweghị agụụ nri so ime ọ dị .
"Ọ gaala izuụka a ole na ole m dị ime."
" Afọ m na-eto kwa ụbọchị mana oge ọbụla m kwuru na 'adị m ime', eji m ezi ịtụnanya ekwu ya.
"Obi m dị m nnukwu ụtọ."









