Aka akparala nwoke kere nwa ya nwaanyị agbụ n’ime ụlọ ruo otu ọnwa

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service
Aka a kparala otu nwoke kere nwa nwaanyị nwunye ya (step daughter) agbụ ma ụkwụ na aka ma kpọchie ya n’ime ụlọ ruo otu ọnwa n’obodo Nise dị n’Awka South nke Anambra steeti.
Kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’Anambra Steeti bụ Ify Obinabo zọpụtara nwata a dị afọ iri na asaa site n’ọnụ ọnwụ n’aka nna ya.
Akụkọ kwuru na a na-eche na nwoke a bụ Sunday Ezeh na-eme ihe ọdịnala chọrọ iji nwata ahụ agwọ ọgwụego.
Kọmishọna Obinabo kwuru na a nwụchiri nwoke a site n’ama ụfọdụ ndị obodo Nise gbara nakwa enyemaka ndị nchekwa ọdịnala.
Ọ dọrọ aka na ntị na gọọmenti Anambra steeti ga-ememina onye ọbụla na-akpagbu ụmụaka na ụmụnwaanyị.
Ugbua nwata nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ebe nna ya ahụ nọ n’aka ndị uweojii.
“Onweghi ihe mere nna m jiri kee m agbụ ụkwụ na aka”

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service
Mgbe nwata a dị afọ iri na asaa kwuru na nna ya kere ya agbụ ụkwụ na aka ma kpọchie ya n’ime ụlọ ruo otu ọnwa na-enyeghi ya nri.
O kwuru na onweghi ike icheta ihe ọjọọ o mere kama na nna sị na ọ nyụrụ nsị ma metọsịa gburugburu ebe ha bi, nke mere o jiri tie ya ihe.
O kwuru na nna ya ji osisi achara kụọ ya n’isi kama na ndị mmadụ zọpụtara ya ma kpọrọ ya gawa n’ụlọọgwụ.
“Naanị ahụhụ ka m tara ya nwa nnupuisi”
Nwoke a sị na ọ bụ obere ahụhụ ka ọ tara nwata nnupuruisi maka iji nsị metọsịa gburugburu ebe obibi bụ nke ọ sị megidere nkwenye omenala ya.
Ọ gara n’ihu rịọ ka a gbaghara ya maka nke ahụ.
Site n’ihe o tiri ya, nwata ahụ merụrụ ahụ nke mere e jiri waa ya isi, mana ugbua ọ na-agbake n’ụlọọgwụ.









