Saint Obi: Odogwu ejije Nollywood, Obinna Nwafor, alaala mmụọ

Obinna Nwafor onye a ma dịka Saint Obi

Ebe foto si, Saint Obi

Onye ejije Nollywood a ma dịka Saint Obi anwụọla.

Akụkọ gbasara ọnwụ Saint Obi, onye ezigbo aha ya bụ Obinna Nwafor, malitere ifesa na soshal midia Naịjirịa kamgbeụbọchị Satọde, mana ọ bụ otu onye ezinụlọ ya aha ya bụ Kenneth Nwadike, gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na nwanne nne ya bụ St Obi anọghịzi ndụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde, o kwuru na ọ bụghị n'ụbọchị Satọde, Mee 13, ka Saint Obi nwụrụ, "ọ gaala ụbọchị olemole ọ nwụrụ", ka Nwadike kwuru mana o kwughị ụbọchị ọ bụ kpọmkwem.

Nwadike kọwara nwanne nne ya bụ Obi dịka "ezigbo mmadụ hụrụ Chukwu n'anya hụkwa ndị ezinụlọ ya n'anya nke ukwuu".

"Ọ naghị achọ nsogbu, ọ bụ mmadụ na-achọ ịnọrọ onwe ya, ọ naghị egbu oge igosi ndị ezinụlọ ya ịhụnanya. Ọ bụ ezigbo nna, nakwa ezigbo di."

"Onwebeghị oge a nụrụ akụkọ ọjọọ ọbụla gbasara ya dịka ọ dị ụfọdụ ndị a ma ama."

Nwadike kwuru na Saint Obi bụ naanị otu nwa nwoke nne na nna ya mụrụ, ụmụnne ya ndị ọzọ bụcha ụmụnwaanyị.

Ihe i kwesịrị ịma maka Saint Obi larala mmụọ

Obinna Nwafor onye a ma dịka St Obi

Ebe foto si, @theofficialsaintobi/Instagram

Nkọwa foto, Ezigbo aha Saint Obi bụ Obinna Nwafor

Obinna Nwafor onye ọtụtụ ma dịka Saint Obi bụ otu n'ime ndị ejije a ma ama so hibe ntọala ngalaba ejije na Naịjirịa a na-akpọ Nollywood.

Ọ gaghị adị mfe ịgụta ejije ole o merela, mana o mebeghị ejije ọbụla na nsonso a.

Saint Obi

Ebe foto si, theofficialsaintobi/Instagram

  • Ezigbo aha ya bụ Obinna Nwafor
  • Ọ bụ onye Mbaitoli n'Imo Steeti
  • A mụrụ ya n'afọ 1965 nke pụtara na o kwesịrị ịdị afọ 57 n'afọ a
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Jos, dị na Plateau Steeti, ebe ọ nwetara ọzụzụ na ngalaba ime ejije a na-akpọ 'Theatre Arts' na bekee
  • Ọ malitere ejije Nollywood n'afọ 1995
  • O nwetakwala nkwanyeugwu dị icheiche n'ọrụ ya dịka onye ejije nke gụnyere:Onye ejije nwoke bụ ọkaibe na Naịjirịa - African Movie Academy AwardsOnye ejije nwoke bụ ọkaibe n'Afrịka - Africa Magic Viewers Choice AwardsOnye ejije nwoke a kacha mara na Naịjirịa - City People Entertainment AwardOnye ejije nwoke bụ ọkaibe - Nollywood movie Awards
  • O so na ndị a kacha akwụ ụgwọ iji mee ejije na Nollywood n'oge ya
  • Saint Obi mechara kwụsị ejije ma hibe ụlọọrụ nke ya nke na-azụlite ma na-akwalite ndị banyere ọhụrụ n'ime ejije
  • Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụ atọ, mana akụkọ kwuru na ya na nwunye ya mechara gbasaa