Leo Mezie: Nwaamadi a na-eme ejije Nollywood alaala mmụọ

Ebe foto si, Leo Mezie Instagram
Onye na-eme ejije Nollywood a ma ama dịka Leo Mezie alaala mmụọ.
Nwanne ya nwoke bụ Tony Mezie gwara BBC Igbo nke a na mgbede Mee 16, 2022 na Mezie nwụrụ ka e tinyechara ya akịrị ọhụrụ n'ahụ.
Tony kwuru na ọ bụ mmiri bara na ngụgụ ya gburu ya dịka otu ụlọọgwụ dị n'Abuja si kwuo.
Nwanne nwoke Mezie kwuru na ezịnụlọ ha ka ga-eziputa ozi maka ọnwụ ya mana o kwuru na Mezie nwụrụ n'ụbọchị Satọde (Mee 14, 2022) gara aga.
Cheta na oge gara aga na onyonyo gosiri ebe Mezie na-agwa ndị otu ya ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka maka ahụike ya fegharịrị na soshal midia.
Ndị dịka ụkọchukwu Johnson Suleiman nyere ya aka mgbe ahụ mana anyị ga-anụta n'ọnụ ezinụlọ ya kpọmkwem ka ihe mere oge ahụ si gaa.
Ihe ndị ikwesiri ịma maka Leo Mezie
- Leo bụ nwa afọ Umuahia bụ isi obodo Abia steeti
- A mụrụ ya n'afọ 1976 nke mere na ọ dị afọ iri anọ na isii (46) tupu ọ nwụọ.
- Ezigbo aha ya bụ Mezie Onyemachi Leonard
- Ọ lụrụ nwaanyị
- Ọ bụ onye na-eme ejije Nollywood
- Ụfọdụ ihe nkiri omerela tupu ọ nwụọ gụnyere Royal Messengers 2, Royal Messengers, Final War, Total War 2, Total War, Heart of a Slave

Ebe foto si, Leo Mezie Instagram




