Agara m mkpọrọ ọnwa 30 n'ihi na m sonyere ndị agha Biafra - Fabian Adibe

Aha onyonyo, Fabian Adibe: "Nsogbu ọrịa glaucoma bụ ihe mere ka m kpuo isi"
Agara m mkpọrọ ọnwa 30 n'ihi na m sonyere ndị agha Biafra - Fabian Adibe

Fabian Adibe bụ aha ọtụtụ mmadụ ma ama n'ejije Nollywood.

O teela aka Adibe ji bido ime ejije TV. Iji maa atụ, o so n'ejije "Things Fall Apart" nke wuru ewu na Naijiria na ngwụcha afọ 1980 ga banye mmalite 1990 ga.

Adibe bụkwa ọkaibe n'ide ejije, dịka o so na ndị na-ede ejije "the new masquerade", nke ọtụtụ mmadụ ji "Zebrudaya" mara.

Mana ugbua, Adibe anaghị emezi ihe ejije n'ihi na ọ naghị ahụzi ụzọ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, na be ya dị n'Owere, Imo steeti, Adibe kowara na ọ bụ nsogbu Glaucoma mere ya ji kpuo isi.

Fabian Adibe

Glaucoma bụ nsogbu anya nke na-eji nwayọọ nwayọọ anapụ mmadụ ihụ ụzọ, ruo mgbe onye ahụ kpuru isi kpamkpam.

Ọnọdụ a enweghị ngwọta, mana ọ bụrụ na a chọpụta ya n'oge, ndị dọkịta ga-enye onye ahụ ọgwụgwọ iji gbochie nsogbu ahụ ịkawanye njọ.

Fabian Adibe kọọrọ BBC Igbo etu o si gụọ akwụkwọ n'onwe ya ma lee ule iji nweta asambodo dị icheiche.

Ọ kọkwara etu o si banye n'otu ndị agha pụrụ iche nke Ọchị agha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'oge agha Biafra; nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere ndụ ya.

Kirie ya n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu.

Fabian Adibe nke Nollywood