'Etu m si malite ejije' - Zakky nke 'New Masquerade'
Tony Akposhere kọwara so na ndị a ma ama n’ime ejije na Naịjirịa.
Na mkparịtaụka a pụrụ iche ya na BBC Igbo nwere, ọ kọrọ etu o si malite ọrụ ejije na nwata, tupu ọ nweta ọrụ n’ụlọọrụ mgbasaozi Nigeria Television Authority na Lagos.
Ebe ahụ ka o si banye n’otu ejije ‘New Masquarade’, nke ya na Zebudaya na ndị ọzọ mere n'ime afọ 90.
Akposhere bụ onye Uhrobo; obodo ya bụ Abraka dị na Delta steeti, mana ọ lụrụ nwaada Igbo aha ya bụ Ugochinyere Akposhere, onye Agbani, Enugwu steeti.
Ha mụrụ ụmụnwaanyị ise nke ụfọdụ n’ime ha mụgoro ụmụ nke ha.

Etu m si malite ejije – Akposhere
Akposhere kwuru na ya malitere ịme ejiji site n'aka John Weyne, bụ onye na-egosi ha ejije ya mgbe ha pere mpe.
Ọ sịkwa na ya malitere na 'National Museum Kitchen' bụ ebe a na-mere ha ejije mgbe ahụ site n'otu a kpọrọ Organisation for Young Artistes.
Ọ sịkwa na akpọgara ha University of Ibadan bụ ebe a nọ kuziere ha ọrụ ejije.
Ebe ahụ ka e si were ya n'ọrụ na NTA, malite ebe ahụ ka njem ọrụ ya malitere.
O kwuru na "ọ dị mkpa ka ụmụ ntorobịa mụta ọrụ ma tinye ụchụ ma mepụta ihe pụrụiche a ga-eji mara onye ahụ".
Mana o kwukwara na "ndị ọgbara ọhụrụ n'ọrụ ejije na-akpasa ha oke", mana ọ nwere ufọdụ n'ime ha na-elebere ha anya.
Akpọshere kwuru na omume ndị ugbua na ndị ụnyaahụ abụghị otu.
Ọ sị na ndị mgbeochie ka akwanye ugwu, mara ọrụ, ma na-asọpụrụ ọrụ ha.


