Ihe ọ ga-ewe ịbụ nwunye Kenneth Aguba - Ụlọụka OPM

Kenneth Aguba ndụ ya gbanwere

Ebe foto si, Omega Power Ministry/Facebook/Screenshot Igbere TV

Nkọwa foto, Mgbanwe mere na ndụ Kenneth Aguba

N'izu ole na ole gara aka, omee ihe onyonyo aha ya bụ Kenneth Aguba bu ogbenye ọnụ ntu enweghị ebe obibi.

Mana ugbua, ndụ ya gbanwere n'otu ntabi anya dịka ụmụagbọghọ na-achọ ya ka akara ọkụ.

Aguba malitere iwu na soshal midia na nsonso a dịka foto ebe ọ nọ n'ebe dị ọ na-arụzi nkwedo wuru na soshal midia.

Ọ gwara otu onye chọgara ya dịka foto ahụ wuru na na o nweghizi ebe obibi nakwa na ọ na-ata ahụhụ ebe ahụ ọ nọ.

Kenneth Aguba mgbe a chọtara ya n'ahịa

Ebe foto si, Screengrab/IgbereTV

Nkọwa foto, Kenneth Aguba mgbe a chọtara ya n'ahịa

Ndị mmadụ malitere ịgosi mwute ha maka ya na-ekwu na ọnọdụ ọ nọ na ya ọ kachasị ugbua ọ bụ okenye adịghị mma.

Ụfọdụ katọrọ otu jikoro ndị na-eme ihe onyonyo bụ AGN ma bo ha ebubo ịgbahapụ Aguba.

Mana onyeisi otu ahụ bụ Emeka Rollas pụtara gọọ nke a ma kọwaa na kemgbe afọ anọ gara aga ka ha na-enyere aka ịchọta n'ebe obibi nakwa ịkwụ ụgwọ nleta ahụike ya.

"Otu anyị anaghị akọrọ ndị ọha maka enyemaka anyị na-enye ndị nọ n'otu a" ka o kwuru n'ozi o depụtara na Instagram.

Akụkọ nwoke ahụ mechara rute ụkọchukwu ụlọụka Omega Power Ministry bụ Chibuzor Chinyere ntị.

O deputara n'akara Facebook ya ka e nyere ya aka chọta nwoke ahụ ebe ọbụla ọ nọ.

A gara ebe ahụ ọ nọ chọta ya, kpọpụta ya ebe ahụ ọ nọ, nye ya ebe obibi ọhụrụ ma nyochaa ya ahụ maka ahụike ya.

Ihe ọzọ ha mere bụ ịchọrọ ya nwunye ọ ga-alụ site n'ozi ha wepụtara n'akara Facebook ha.

Ọ bụzị nke a mere ka ọ ghọrọ akara ọkụ dịka ọtụtụ ụmụnwaanyị pụtara na-azọ onye ga-abụ nwunye ya.

Kenneth Aguba

Ebe foto si, Omega Power Ministry

Nkọwa foto, Kenneth Aguba n'ụlọ obibi ọhụrụ nke ụlọụka OPM nyere ya

Ihe ọ ga-ewe ịbụ nwunye Aguba dịka OPM si kwu

Dịka ụlọụka OPM na-achọrọ Aguba nwaanyi si kwuo, o nwere ụfọdụ ihe ọ ga-ewe ndị chọrọ ịbụ nwunye ya.

Ha kwuru sị na ha ga-akwụ ụgwọ niile gbasara mmemme alụmdinanwunye ahụ mana:

  • - Ya na nwaanyị ahụ ga-ebi afọ iri ma ha gbachaa akwụkwọ n'enweghi esemokwu nakwa agbaghị arụkwaghịm rue mgbe afọ iri ahụ gachara. Oge ahụ gachaa, nwaanyị ahụ chọọ ọ pụọ, ọ chọọ ọ nọrọ.
  • - Ha ga-enwe otu ọba ego maka azụmahịa ụlọụka ahụ ga-ebidoro ha. Nke a pụtara na ha ga na-agakọ ụlọakụ mgbe ọbụla ha chọrọ ịsepụta ego.
  • - Onye ahụ agaghị anagha ya mmekọrịta dị n'etiti di na nwunye.
  • - Ndị si n'ụlọụka ahụ ga na-eleta unu otu mgbe kwa ọnwa iji hụ na ihe niile na-aga nke ọma.

"Onye ọbụla kwtara ihe ndị a zita akara ekwenti gị ka anyị malite njem alụmdinanwunye (unu)" ka ha kwuru.