Libya Flood: Ndị nwụọrọla n'oke Idemmiri Libya nwere ike iru 20,000

Ndị ọrụ gbatagbata na-arụ ọrụ na Libya

Ebe foto si, Reuters

Mayọ Derna, obodo dị n'ikpe mmiri na mba Libya ekwuola na ihe ruru agbata mmadụ 18,000 na 20,000 bụ ihe nwụọrọla dịka idemmiri si noke mmiri ọzizo tịwara ọdọmmiri dam abụọ, mmiri were wakpoo ndị mmadụ dịka ha nọ n'ụra.

Abdulmenam Al-Ghaithi ngwara ụlọ ntaakụkọ al-Arabiya TV na ya gbadoro ụkwụ na mpaghara ole mmiri ide ahụ wakporo ma kwuo na ndị otu nwere mkpa ndị ịzọpụta ozu ndị mmadụ doro anya.

Otu onye ọrụ Gọọmentị na-achị Ọwụwa Anyanwụ Libya nke isi ụlọọrụ ha dị na Tobruk kwuru na "osimiri na-atụpụta ozu ọtụtụ ndị mmadụ".

Ihe kaịrị mmadụ 5000 bụ ndị a ma na ha anwụọla , ebe a na-achọ o pekata mpe mmadụ 10,000 achọ.

Oke mmiri ọzụzọ nke e kwuru bụ ụdị mmiri na ezo ụgbọrọ 260 zọrọ n'otu ụbọchị n' obodo mmiri anaghị ezokarị nke butere idemmiri gbawara ọdọmmiri 'dam' abụọ.

Ndị ọrụ gbatagbata si mba Ijipt, Tunisia, Italị, Spen na Tọki agawala inyere ndị nke mba ahụ aka n'ọrụ.

Idemmiri na Libya

Ebe foto si, Screengrab

Otu mbaụwa bụ UNN na-adọ aka na ndị na ọrịa sitere na mmiri a gbarụrụ agbarụ bụ ihe ga-eso ga-eso ya bnụ ọdachi.

Otu United Nationa na-ahụ maka ọnọdụ ihu igwe (UN's World Meteorological Organization) kwuru na a kara egbochili ọtụtụ ọnwụ mere n'ihi oke idemmiri ahụ.

Petteri Taalas gwara ndị ntaakụkọ sị na mba ahụ kara ezipu ozi ịdọaka na ntị.

“Ndị ọrụ gbagbata gaara enwe ohere ịkpọpụ ndị mmadụ nke pụtara na a gara egbochi ụfọdụ ọdachi ọnwụ ndị a nile,” d ịka ụlọntaakụkọ AFP si kwuo.

Mba Libya nwere gọọmentị abụọ na-arụ onwe ha aka n'anya nke mere ka o sie ike ijikọta aka were sochie ọdachi ahụ dakwasara mba ahụ.

E likọtala ozu ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'Idemmiri mere na mba ahụ

Aha onyonyo, Libya floods: Floods devastate city of Derna

E liela ozu ọtụtụ mmadụ ahụ nwụrụ n’ihi idemmiri mere n’obodo Berna nke mba Libya n’ili e gwuru ọha.

Ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị atọ nwụrụ 2,300 mgbe oke ifufe butere idemmiri nke kpochasịrị obodo Derna n’ụbọchị Sọnde dịka ọdọmmiri ‘dam’ gbawara.

E ji igwe na-egwu ala nke nnukwu gwuo ili ebe e likọtara ozu niile ahụ ọnụ n’ọdọ ebe a na-eli ozu.

Akụkọ kwuru na a ka na-achọ ihe ruru mmadụ puku iri (10,000) achọ, nke pụtara na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịrịkwu elu.

Mohammed Qamaty bụ onye ọrụ gbata gbata sị na ha ka na-achọ ndị nke a metụtara.

“Anyị na-akpọku ndị Libya niile nwere ọzụzụ na ngalaba ahụike ka ha biko gbatara anyị ọzọ enyemaka, anyị enweghi ndị nlekọta ahụike nọọsụ zuru ezu, anyị chọrọ enyemaka,” ka ọ gwara ndị ntaakụkọ Reuters.

Maapụ na-egosi mpaghara Libya ihe a mere

A hụla ozu mmadụ karịrị 2000 ka ha tọgbọọ n'ụzọ

Idemmiri mere na Libya

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ puku mmadụ anwụọla dịka oke ifufe butere oke idemmiri na mba Libya.

Onyeisi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Libya nke mbaụwa akwadoghi kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla akarịala puku abụọ ebe a na-achọ ọtụtụ achọ.

Onye ọrụ pụrụiche na Libya bụ Jalel Harchaoui gwara BBC na ndị nwụrụ nwereike iru “ọtụtụ puku” mmadụ.

Oke ifufe a kpọro ‘Storm Daniels’ dakwasịrị mba ahụ n’ụbọchị Sọnde nke mere e jiri tinye ọnọdụ gbata gbata.

Ndịagha mba Libya mmadụ asaa na-efu efu oge ha na-agba mbọ ịzụpụta ndị mmadụ.

Ụlọ mmiri rikpuru na Misrata

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọ dị n'obodo Misrata, mpaghara north-west nke Libya, mmiri rikpuru ya
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Obodo ndị idemmiri metụtara gụnyere Benghazi, Sousse, Derna na Al-Marj.

Ndị ọrụ Red Cross na Libya kwuru na ihe ruru ụlọ otu narị na iri ise (150) emebiela n’idemmiri ahụ.

Ha kwuru ọdọmmiri ‘dam’ abụọ dị na Derna ebe mmadụ ruru 100,000 bi mebiri ebe mmiri dị na ya riri ọtụtụ ụlọ na ndị mmadụ bi ebe ahụ.

Onye ọrụ gọọmentị na Derna kwuru na a hụla ozu mmadụ karịrị otu puku (1000).

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hichem Chkiouat kwuru na “ozu ndị mmadụ tọgbọ ebe niile.”

“Ọnụọgụgụ ozu ndị a hụrụ n’obodo Derna karịrị otu puku (1000),” ka ọ gwara ndị ntaakụkọ Reuters.

“Anaghị m atụ asị mgbe m kwuru na pasentị 25 ndị bi n’obodo efuola n’idemmiri. Ọtụtụ ụlọ adaala.”

Libya nọ n’oke ọgbaghara kamgbe a chuturu ma gbuo onye ndu ha bụ Muammar Gaddafi n’afọ 2011 – nke butere nkewa nakwa ọchịchị mpaghara dị iche iche site na Tripoli bụ isiobodo ruo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mba ahụ.

Onye ntaakụkọ na Libya bụ Abdulkader Assad gwara BBC na ihe mere enweghi ezi ndị ọrụ gbata gbata na-azọpụta ndị mmadụ n’idemmiri

Idemmiri mebiri ụlọ dịka ọ na-asụ na-agafe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Idemmiri mebiri ụlọ dịka ọ na-asụ na-agafe
Akwammiri dị n'obodo Shahhat

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Idemmiri a mebiri akụkụ akwammiri dị n'obodo Shahhat ka oke ifufe na-efe
Ụzọ idemmiri kewara abụọ na Libya

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, O ebiri ọtụtụ okporoụzọ na ngwa ndị e ji ebi ndụ