Morocco Earthquake: Etu nwata a mụrụ n'oge alaọmajijiji siri gbanahụ ọnwụ

nwata a mụrụ n'oge alaọmajijiji

Ebe foto si, bbc

Nkọwa foto, A mụrụ nwa Khadija nkeji ole ma ole tupu alaọmajijiji tara isi ọtụtụ mmadụ emee

A gụbeghi nwa Khadija aha, mana ụlọ mbụ o biri bụ ụlọikwuu a kpọrọ 'tent' na Bekee nke nọ n’akụkụ okporoụzọ.

A mụrụ n’ime nkeji ole ne ole tupu oke alaọmajijiji emee n’abalị Fraịde.

Na-agbanyeghi na nne na nwa emerụghị ahụ, mana a gwara ndị nọ n’ụlọọgwụ dị na Marrakesh ebe a mụrụ ya pụọ n’ime awa atọ a mụchara ya.

“A gwara anyị pụọ n’ihi ụjọọ ọdachi alaọmajiji a butere,” ka nne ya kwuru.

Khadija na di tinyere nwa ọhụrụ banyere ụgbọala n’ụtụtụ Satọde ma gawa n’obodo ha bụ Taddart dị n’ugwu Atlas, ji kilomita 65 dị nso na Marrakesh.

Mgbe ha ruru n’ụzọ, ha chọpụtara na ogwute si n’alaọmajijiji ahụ dachisiri okporoụzọ, ebe ha nwereike runwuo bụ n’obodo Asni.

Kamgbe ahụ ha bi ma na-ehi ụra n’otu ụlọikwuu dị n’akụkụ okporoụzọ.

“Enwetebeghi m enyemaka ọbụla site n’aka gọọmentị,” ka ọ gwara anyị, dịka o ku nwa ya n’aka na-ezere anwụ n’okpuru ‘tarpaulin’.

“Anyị rịọrọ ụfọdụ ndị obodo ka e nye anyị akwa mkpuchi oyi ka anyị kpuchie onwe anyị.”

Kamgbe ahụ ha gbalịala rụpụta ụlọikwuu. Khadija gwara anyị na ọ bụ naanị otu akwa ka nwa ọhụrụ ya na-eyi kamgbe ahụ.

“Naanị Chineke ka anyị nwee,” ka o kwuru.

Ndị enyi ha bi n’obodo ha gwara ha na alaọmajiji ahụ metụtara ụlọ ha ebe ọ dị ukwuu, ha amabeghi mgbe ha ga-enwete ebe ọzọ ha nwereike ịnọ.

Mkpalite iwe

Ọtụtụ ndị nọ n’ụlọikwuu dị n’akụkụ nke Khadija ha na-enwezi ọtụtụ mgbakasị ahụ maka enweteghi ezi enyemaka n’obodo dị n’akụkụ ugwu nke Marrakesh.

Asni ji kilomita 50 dị nso na Marrakesh mana ndị mmadụ kwuru na ha chọrọ enyemaka ngwa ngwa.

Ndị na-eche enyemaka n'aka gọọmenti gbara onye ntaakụkọ okirikiri
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị iwe dị n'obi na-eche enyemaka n'aka gọọmenti gbara onye ntaakụkọ okirikiri

Ụfọdụ ndị na-ewe iwe gbara onye ntaakụkọ okirikiri na-achọ ibusa ya iwe ha.

“Anyị enweghi nri, anyị enweghi achịcha maọbụ akwụkwọ nri. O nweghi ihe anyị nwe,” otu onye n’ime ọha kwuru.

“O nweghi onye gbataara anyị ọsọ enyemaka, o nweghi ihe anyị nwe. Naanị Chineke na Eze anyị ka anyị nwe.”

Ndị uweojii nyere aka kpọpụta onye ntaakụkọ n’ime ọha ndị a na-ewe iwe dịka ọtụtụ n’ime ha chọrọ ịwakpo ya.

Ụlọikwuu

Ụfọdụ kwuru na ha nwetere ụlọikwuu n’aka gọọmentị mana ọtụtụ ọ gaghị ezuru ọtụtụ ndị mmadụ ka chọrọ ya.

Otu nwaanyị a kpọrọ Mbarka, du anyị gaa n’akụkụ ụzọ ruo n’ụlọ ya ebe alaọmajiji lara n’iyi.

Alaọmajijiji lara ụlọ Mbarka n'iyi
Nkọwa foto, Alaọmajijiji lara ụlọ Mbarka n'iyi

Enweghi m ego m ga-eji rụgharịa ụlọ m, amaghị m ihe m ga-eme,” ka Mbarka kwuru.

“Ugbua ọ bụ naanị ndị obodo na-enyere anyị aka.”

Ya na ụmụ abụọ ya ndị nwaanyị na di nwa ya bi gụnyere ụmụ ụmụ atọ.

Ha ji ọsọ si n’ime ụlọ ha gbapụta dịka ọ na-amajijiji, ọ fọrọ obere ihe ka otu nnukwu ụlọ dakwasị n’okporoụzọ mgbe ha na-agba ọsọ.

“Anyị nwere ebumnobi na gọọmentị ga-enyere anyị aka,” di nwa ya bụ Abdelhadi kwuru, mana obodo dị na gburu gburu ebe ahụ ruru otu narị na iri abụọ (120).