Alaọmajijiji egbuola ihe ruru mmadụ 920 n'Afghanistan

Alaọmajijiji egbuola ọtụtụ n'Afghanistan

Ebe foto si, Afghan Government News Agency

Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata ji ụgbọelu helikọpta erute mpaghara Paktika

Alaọmajijiji egbuola ihe ruru mmadụ narị itoolu na iri abụọ (920) ma merụọ ọtụtụ ahụ na mba Afghanistan, dịka ụlọntaakụkọ mba ahụ si kwuo.

Foto gosiri ụlọ ndị mebiri emebi na ebe ala dara ada na mpaghara Paktika, ebe ndị ọrụ gbatagbata na-agbalị inye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwọ.

N'ebe ndị bụ ime obodo, e ji ụgbọelu helịkọpta na-ebuga ndị mmadụ ụlọọgwụ.

Ụlọntaakụkọ Bakhtar Newa Agency nke mba ahụ kwuru na ọnụọgụgụ ndị ya bụ alaọmajijiji tara isi ha ka ga-arị elu, dịka ọ merụrụ ihe karịrị mmadụ 600 ahụ.

Ya bụ alaọmajijiji mere n'akụkụ obodo Khost, ebe elekere iri nke abalị Tuzde (n'oge Naịjiria nke bụ elekere mbụ nke isi ụtụtụ n'oge ndị Afghanistan), mgbe ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụra.

Bilal Karimi bụ ọnụ na-ekwuru gọọmentị mba Afghanistan dere na Twitter ya sị "N'abalị ụnyaahụ, oke alaọmajijiji mere n'obodo anọ na mpaghara Paktika, nke gburu ma merụọ narị kwuru narị ndị be anyị ahụ ma mebie ọtụtụ ụlọ.

"Anyị na-arịọ ndị ọrụ enyemaka niile ka ha ziga ndị mmadụ na mpaghara ahụ ozugbo, iji gbochie nnukwu ọdachie ọzọ."

Foto si Patkita gosiri etu alaọmajijiji si mebie ụlọ ndị mmadụ

Ebe foto si, @ALHAM24992157

Nkọwa foto, Foto si Paktita gosiri etu alaọmajijiji si mebie ụlọ ndị mmadụ
Ndị Afghanistan na-ebupu ndị alaọmajijjiji merụrụ ahụ

Ebe foto si, AFGHAN GOVERNMENT NEWS AGENCY

Nkọwa foto, Ihe onyonyo gosiri ka a na-ebupu ndị alaọmajijjiji merụrụ ahụ
Alaọmajijiji egbuola ọtụtụ n'Afghanistan

Ebe foto si, AFGHANISTAN INFORMATION SERVICE

Alaọmajijiji na-emebikarị ihe na mba Afghanistan bụ mba ebe e nwere ọtụtụ ime obodo nwere ụlọ ndị a na-arụsighi ike.

A nụrụ alaọmajijiji ahụ n'ihe karịrị kilomita 500, ndị Pakịstan na India ma na ụdịrị ihe a mere n'Afghanistan.

Ndị nọ mgbe o mere kwuru na ha nụkwara ya n'isiobodo Afghanistan bụ Kabul nakwa Islamabad bụ isiobodo Pakịstan.

Maapụ na-egosi ebe ihe mere
Nkọwa foto, Maapụ na-egosi ebe ihe mere

N'ime afọ iri gara aga, alaọmajijiji egbuola ihe karịrị mmadụ puku asaa (7,000) na mba Afghanistan, dịka ngalaba ụlọọrụ United Nations na-ahụ maka enyemaka si kwuo.

Opekatampe mmadụ 560 na-anwụ site n'alaọmajijiji kwa afọ.