Naịjirịa ga-azụta ihe eji enyocha ala maka alaọmajiji

Okwute Zuma

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ego ruru nde dọla 50 a ga-eji ịzụta ngwọọrụ ga-enyere ha aka inyocha mara ihe na-eme n'ime ala nakwa ileta alaọmajijiji.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka igwu ala a na-akpọ Nigerian Geological Survey Agency na bekee bụ Alex Nwegbu kwuru nke a n'Abuja ka ndị mmadụ kwuchara n'ala mara jiji n'Abuja ụnyaahụ.

Nwegbu bụ onye tinyere ọnụ n'okwu alaọmajijiji ahụ kwuru ka ụjọ ghara ịtụ ndị mmadụ na o nweghi ihe na-eme.

O kwuru ka alaọmajijiji ahụ mere na Mpape ghara ịmapụ ndị mmadụ obi maka na ndị ọrụ ya amalitela inyocha ebe ahụ ozugbo.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Nwegbu kọwara na ụdị ịma jijiji a emela na mba ndị ọzọ dịka Gana, Gini, Laiberia, Kameruun na ebe ndị ọzọ.

Mana ndị ọrụ ha ne-eme nyocha tọrọ atọ banyere ya bụ ihe n'ebe o mere iji mata ihe kpatara ya na ihe a ga-eme gbasara ya.

Cheta na alaọmara jiji mere n'isi ụtụtụ ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2018 mana omebighị ihe ahụrụ anya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: