Akụkọ kachasị mkpa: David Mark esonyela na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Ebe foto si, Getty Images
David Mark bụbu onyeisi ụlọomeiwu Sineti na Naịjirịa apụtala ikwu na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2019.
O mere nke a dịka o gotere akwụkwọ mbanye ya n'isi ụlọọrụ PDP n'Abuja n'ụbọchị Tuusde.
Ọzọ,

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo asaala Atiku Abubakar maka okwu 'restructuring'.
Ọ gwara Atiku na nhazi obodo agaghị ekpochapụ nsogbu ụbịam na Naịjirịa, na ihe ka mkpa bụ ibuso agha megide mpụ.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye rụburu n'isi ụlọọrụ mba Amerịka bụ Monica Lewinsky, eweela iwe pụọ n'ebe a na-enwe mkparịtaụka mgbe a jụrụ maka mmekọ ya na Bill Clinton n'oge gara aga.
Lewinsky mere nke a dịka ya na onye ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka na mba Israel.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Aka na-achịkọta otu egwuregwu Manchester United bụ Jose Murionho ejirila obere ihe gbahapụ ụlọ mkpọrọ na mba spain n'ihi akwụghị ụtụ isi.
Akụkọ kwuru na o kwetara ịkwụ nha ruru nde dọlla abụọ n'ọma.
Gee Nkeji nke mgbede a:
China ga-enye Naịjirịa ego

Ebe foto si, Getty Images
China ekwela nkwa inye Naịjirịa nakwa ụfọdụ mba Afrịka ndị ọzọ, ijeri dọla iri isii nke ha ga-eji emeziputa ma mepee obodo.
Onyeisiala ha bụ Xi Jinping kwuputere nke a n'ọgbakọ 'Forum on China-Africa Cooperation' nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ na ya ugbua.
Buhari na nhazigharị iwu ntuliaka
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekweghi ebinye aka n'akwụkwọ ga-agbanwe iwu na-ekpuchite ntuliaka.
Nke a ga-eme ya ugboro atọ o na-ekweghi eme ka nhazigharị a ndị omeiwu mere bụrụ iwu.
Mana o kwuru na ihe kpatara o ji mee nke ugbua bụ makana ọ dịbeghi etu o kwesịrị.
Egela Ipob ntị
Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa gwara ndị bi na mpaghara ahụ ka ha ghara ige otu chọrọ ka e kewaa Naịjirịa bụ Ipob ntị.

Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu
Kọmishọna ndị uweojii n'Anambara bụ Garba Umar kwuru na Ipob bụ otu iwu machiri, nke mere na ha enweghi ikike inye onye ọbụla iwu.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Tajudeen Agunbiade bụ nwaafọ Naịjirịa nwetara ihe nrite ọlaọcha n'asọmpi ndị nwere ọrụsị na-apịa tenis e mere na mba China.
N'ime ndị Naịjirịa anọ gara asọmpi a, naanị Agunbiade ruru agba ngwụcha, nke mere ka o tozuo isonye n'asọmpi nke mbaụwa a ga-eme na mba Slovenia n'Ọktoba.











