Morocco Earthquake: Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’alaọmajijiji a eruwela 2500

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’ọdachi alaọmajijiji mere na mba Morocco achụwala puku abụọ na narị ise (2500) dịka ọtụtụ merụrụ ahụ.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo kwuru na mmadụ ruru 1400 nwere nnukwu mmerụ ahụ na ndị ọkachasị metụta bụ ndị nọ na mpaghara South Marrakesh.
Ndị ọrụ gbata gbata ka na-agba mbọ ịzụta ọtụtụ ndị mmadụ tọọrọ n’ụlọ ndị dara ada dịka ha na-achọ ụzọ a ga-esi ebubata ngwa ọrụ e ji azọpụta ndị mmadụ.
Nke a mere ọtụtụ ndị bi n’ime ime obodo ji were aka na-apọkaasị aja ụlọ iji zọpụta ndị tọọrọ n’ime ha.
N’obodo Tafeghaghte ihe karịrị ọkara ndị bi ebe ahụ anwụọla ebe a ka na-achọ ọtụtụ achọ.
N’obodo ọzọ, otu nwoke kwuru na o nwere ohere ịhọrọ ịzọpụta nwa ya maọbụ nne na nna ya.
N’aka nke ọzọ, otu nwata a mụrụ na nkeji ole ma ole tupu alaọmajijiji a amalitela ehiela n’ụlọikwuu dị n’okporoụzọ ụbọchị atọ.

Ebe foto si, EPA
Ọtụtụ ndị mba Morocco jụrụ ịlaghachị n’ụlọ ha n’ihi ụjọọ na ọdachi a ka nwereike ime ọzọ, ya mere ha jiri na-ehi n’ezu kamgbe ụbọchị Fraịde.
Alaọmajijiji kachasị ibe nke ogogo ya ruru ‘6.8 Magnitude’ dakwasịrị Morocco.
Ebe ihe a mere kpọmkwem bụ n’elu ukwu ‘Atlas’ nke dị na 71km (44maịlị) mpaghara South-west nke Marrakesh nke omimi ya dị kilomita 18.5 dịka ndị nyocha mba Amerịka si kwuo.

Ebe foto si, Reuters
Ya bụ ala ọmajijiji malitere ebe o ji elekere iri na otu gafee elekere iri abụọ na atọ n'abalị Fraịde. Ọzọ mekwara dịka nkeji iri na itoolu gafere.
Ndị mmadụ nwụrụ na Marrakesh nakwa n'ọtụtụ obodo dị na ndida obodo ahụ.
Ọtụtụ ndị nwụrụ bi n'ime ime obodo adịghị nso na nnukwu obodo.
Minista ime obodo mba ahụ kwuru na alaọmajijiji a gburu ndị mmadụ n'obodo al Haouz, Marrakesh, Ouarzazate, Azilal, Chichaoua nakwa al-Haouz, Marrakesh na Taroudant, ma kwuo na opekatampe mmadụ 329 merụrụ ahụ na ya.

Ebe foto si, EPA

Ọtụtụ ndị mmadụ lahụrụ na mpụta be ha dịka gọọmentị ala ha dọrọ ha aka na ntị ha alaghachina n'ime maka egwu alaọmajijiji ọzọ.
Ụlọọgwụ ndị dị n'obodo Marrakesh ejula eju ebe ndị merụrụ ahụ nọ dịka a na-arịọ ndị mmadụ ha bịa nye onyinye ọbara iji nye ndị mmadụ aka.
Akụkọ na-ekwu na o nwere ụfọdụ ezinaụlọ tọrọ n'okpuru ụlo ha dakwasịrị ha nakwa na Medina bụ ebe dị mkpa Unesco kwuru emebiela.
Ụfọdụ ụlọ adaala dịka otu onye bi ebe ahụ sị gwa ụlọntaakụkọ Reuters, ụfodụ ihe onyonyo dị na X egosila ebe ụlọ na-ada mana BBC achọpụtabeghi ebe ha mere n'ezie.

Ebe foto si, Reuters













