Gịnị bụ autopsy? Kedụ oge ọ na-ewe ịhụ mpụtara ya?

Ozu a na-eli eli

Ebe foto si, Femi Adesina

Dịka ndị mmadụ na-eche ịhụ mpụtara nyocha ozu otiegwu a ma ama bụ Ileroluwa Aloba a ma dịka Mohbad, o nwere ajụjụ dị ụfodụ mmadụ n'ọnụ.

Nke a bịara dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Ben Hundeyin kwuru na ha emecheela nyocha ozu nwa amadi ahụ bụ nke abọpụtara n'ili ya.

Ha mere nke a n'ihi na ndị nso otiegwu ahụ na-ekwusi ike na ọnwụ ya edoghi anya nke mere ka ekpebie inyocha ya ozu.

Mana gịnị bụ 'Autopsy' bụ nyocha ozu na Bekee?

Gịnị bụ autopsy? Kedu oge ọ na-ewe ịhụ mpụtara ya?

Abọpụtara ozu otiegwu Mohbad iji nyocha ya

Ebe foto si, Mohbad/Instagram/Screengrab

Nkọwa foto, Abọpụtara ozu otiegwu Mohbad iji nyocha ya

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nyocha ahụ ndị nwụrụ anwụ kọwaara BBC Igbo na Autopsy pụtara "iji usoro pụrụiche nyochaa ahụ onye nwụrụ anwụ iji chọpụta ihe gburu ya nakwa ịchọpụta ma o nwere ọrịa ọbụla dị n'ime ahụ onye ahụ n'agbanyeghi na ọ bụghị ya butere ọnwụ".

O kwukwara na e nwere ụdịrị nyocha ahụ ozu dị icheiche mana ha niile gụnyere ịwa ahụ.

Onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu achọghị ka akpọo aha ya kọwara na e nwere nyocha bụ naanị nke ime ahụ, nwekwa nke bụ itulee akụkụ ahụ dị icheiche ọfụma ọfụma.

Ya bụ usoro pụrụiche na-ewe naanị ụfọdụ elekere dịka onye ahụ si kwuo mana nyocha akụkụ ime ahụ dị icheiche na-ewe izuụka ole na ole.

Inyocha kwa mmiri ime ahụ dị icheiche a hụrụ n'ime ahụ na-ewe otu ọnwa maọbụ karịa.

Ihe ndị ọzọ na-agbanwe oge nyocha ozu ga-ewe bụ

- ọ bụru na onye ahụ buru ibu, ọ ga-ewe oglogo oge ime ya nyocha karịa onye dị gịrịgịrị

- ọ bụrụ na o teela aka onye ahụ nwụrụ n'ihi na a ga-ebu ụzọ mee nyocha DNA ị ma maọbụ onye ahụ n'ezie.

- ọ bụrụ na eteela onye ahụ kemịkal nchekwa ozu bụ 'embalment' na Bekee, ọ ga-ete aka ịwa onye ahụ ahụ n'ihi na ahụ esiela ike.

Ị chọọ ịme autopsy, kedụ ụzọ ị ga-esi?

Nyocha ime ahụ iji chọpụta ihe gburu mmadụ bụ Autopsy

Ebe foto si, Getty Images

O nwere ụfọdụ ụzọ ịkwesiri iso were nweta ikike ime nyocha ime ahụ onye nwụrụ.

- Ị ga-ekpesa okwu ahụ n'aka ndi uweojii

- Ị ga-enwe ngalaba kwụ gị n'azụ ihe dịka ụlọogwụ na-akwado gị ime nke a.

- Ọ bụrụ na ị nọ na Legọs, ụlọogwụ LASUTH nakwa LUTH bụ ebe abụọ ga-anabata ịme ya bụ nyocha.

- O nwekwara ụfọdụ ụlọ nchekwa ozu nwere ikike ime nyocha ime ahụ a mana dịka iwu Legos steeti si nye ọ bụ naanị dọkịta pụrụiche bụ 'Pathologist' na Bekee nwere ikike ime nyocha a.