Prominent Igbo deaths in 2022: Ụfọdụ ndị Igbo a ma ama lara mmụọ n’afọ a

Ndị Igbo a ma ama nwụrụ n'afọ 2022.

Ebe foto si, Osinachi/Nwadike/Ada Ameh/Davido

Dịka afọ 2022 na-akụrụ ọnụ, ọtụtụ ndị na-agụkọ ihe ọma ndị meere ha ebe ndị ọzọ na-ebe akwa ọdachi mere ha.

Otu ihe gbapụtara ihe n’afọ a bụ ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onye ukwu, onye nta, ọgaranya, ụmụaka nakwa ndị okenye.

N’ime akụkọ a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ndị Igbo a ma ama zutere ọnwụ ha n’ime afọ 2022.

Ndị a nwụrụ n’ala Igbo gụnyere;

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Osinachi Nwachukwu

Nwada Igbo bụ onye a ma ama na-eti egwu ụka

Ebe foto si, Osinachi Nwachukwu

Nwada Igbo bụ onye a ma ama na-eti egwu ụka nwụrụ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ afọ 2022, ka ọ dị afọ iri atọ na anọ.

Ọnwụ ya nwada a olu ya dịka nke ndị mmụọ ozi dara ezigbo ụda na Naịjirịa gbaa gburu gburu.

Ngọtahie dị n’ọnwụ ya bụ na ezinaụlọ ya na-ebo di ya bụ Peter Nwachukwu ebubo maka ọnwụ ya ma sị na o tigburu ya.

Ugbua dị ya nọ n’aka ndị uweojii dịka okwu ya ka dị n’ụlọikpe.

Ifeanyi Davido Adeleke

Otu nwa nwoke Davido nwụrụ anwụ

Ebe foto si, Ifeanyi Adeleke/Instagram

Ọnwụ Ifeanyi Adeleke bụ otu nwa nwoke otiegwu a ma ama bụ David Adeleke e ji Davido maara gbawara obi ndị Naịjirịa nakwa mbaụwa.

Nwata a dị naanị afọ atọ nwụrụ n’ụbọchị 31 Ọkụtoba, 2022 mgbe mmiri riri ya n’ụlọ ha dị na Banana Island, Legọs Steeti.

Ọnwụ ya bụ ezigbo ihe anya mmiri nye ezinaụlọ Adeleke, ndị Naịjirịa nakwa mbaụwa bụ so ezinaụlọ ya rie uju ya.

Ọ bụ eziokwu na ezinaụlọ ha bụ ndị Yoruba mana nnenne ya ochie bụ onye Igbo ya mere nna ya jiri gụọ ya aha ‘Ifeanyi’.

Mbazulike Amechi

Amechi bụ dike Igbo ji eme ọnụ

Onye bụbu minista njem ụgbọelu bụ Mbazulike Amaechi lara mmụọ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2022, mgbe ọ dị afọ 93.

Dike a Igbo ji eje mba so Nnamdi Azikiwe na ndị ọzọ lụọ agha maka mwereonwe Naịjirịa site n’aka mba Briten ma soro hiwe ọchịchị Naịjirịa nke mbụ a kpọrọ ‘first republic’.

Amechi bụ onye Nnewi dị n’Anambra Steeti nwụrụ n’ime otu afọ nwunye ya bụ Chinelo nwụchara.

Ọ gbapụtara ihe n’ikwu okwu banyere mmegbu ndị Igbo na Naịjirịa ma duru ndị ndu Igbo gaa rịọ Onyeisiala Buhari ka a tọhapụ onyendu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.

Alexander Madiebo

Madiebo bụ ọchịagha Biafra n'oge agha

Alexander Madiebo bụ onye agha Naịjirịa nakwa Biafra nwụrụ n’ụbọchị atọ nke ọnwa Juun afọ 2022.

A mụrụ ya n’obodo Umuokpu dị n’Awka Anambra Steeti n’afọ 1932, ọ banyere n’ọrụ ndịagha n’afọ 1954.

N’oge agha Biafra, Madiebo rụrụ ọrụ dịka otu n'ime ndị na-eso Odumegwu Ojukwu ma jiri ọkwa ọchịagha na-achịkọta ndiagha Biafra site n’afọ 1967 ruo 1970.

Ọ gara ọtụtụ agha udo na mba ndị ọzọ dị iche iche gụnyere Kongo.

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ifeyinwa Madiebo ma mụta ọtụtụ ụmụ tupu ọnwụ ya.

George Obiozor

George Obiozor

Ebe foto si, Ohaneze ndigbo

Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor nwụrụ n'ebe ngwụcha ọnwa Disemba 2022 dịka Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodimma si kwuo n’abalị ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba a.

Uzodinma kwuru na ọnwụ ya bụ oke ihe funahụrụ ndị Igbo, Naịjirịa nakwa mbaụwa gbaa gburu gburu maka ụdịrị akụnauche Obiozor nwere.

Ọ gbara afọ 80 tupu ọ laa mmụọ.

O dochabenghi anyị etu o siri laa mmụọ mana Uzodinma kwuru na n'oge na-adịghị anya a ga-ezipụta ozi banyere olili ya nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị iri nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ka Obiozor meriri ntulịaka nke ọnyeisi otu Ohaneze ndigbo.

Ọ bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị Igbo nke bụ Ohaneze ndigbo. Ọ bụ ọkankuzi ma rụọkwa ọrụ dịka onye nnọchite anya Naịjirịa na mba Amerịka, Izrel na Sịprụs.

Chinedu Nwadike

Ọ na-agbara Gozie Okeke egwu tupu ọ malite iti nke ya

Ebe foto si, Chinedu Nwadike/Instagram

Chinedu Nwadike bụ nwafọ Igbo ọzọ na-eti egwu ụka a ma ama nwụrụ n’ụbọchị 27 Maachị afọ 2022.

Nwamadị a bụ nwafọ Imo Steetị s n’ọrịa ‘kidney’ gbakee mana dịka ọ na-akwado ịga mba India maka inyocha ahụ ọfụma ka ọ gbabiiri nwụọ.

Ọ na-agbaburu Gozie Okeke egwu tupu ọ malite iti egwu nke ya.

Ọ lụrụ nwunye ya bụ Dorah Dike ma mụọ ụmụ atọ tupu ọ nwụọ.

Romanus Amuta (Natty)

E ji Natty maara ya n'ejije New Masquerade

Ebe foto si, Romanu Amuta

Romanus Amuta bụ nwafọ Igbo mere ihe nkiri mgbe gboo e ji Natty maara n’ihe nkiri ‘New Masquerade’ nwụrụ na 9 Febụwarị afọ 2022 ka ọ rịachara ọrịa.

Nwafọ Udi Enugwu Steeti a a mụrụ n’afọ 1942, nwụrụ dịka ọ gbachara afọ iri asaa na itoolu (79years).

Tupu ọnwụ ya, Amuta lụrụ nwunye ya bụ Cordelia Amuta ma mụọ ụmụ isii.

Ada Ameh

Ọ nwụru n'ime afọ abụọ nwa ya nwaanyị nwụchara

Ebe foto si, Ada Ameh/Instagram

Nwada a ma ama na-eme ihe nkiri bụ Ada Ameh nwụrụ n’ụbọchị 17 Julaị, 2022 ma gbawa obi ọtụtụ ndị enyi na ezinaụlọ ya.

Nke a na-abịa n’ime afọ abụọ otu nwaanyị ya bụ Aladi Godgift Ameh nwụchara n’ọnwa Ọkụtoba, afọ 2020.

Nwafọ Idoma nke Benue Steeti nwụrụ dịka ọ gbachara afọ iri anọ na asatọ (48yrs).

Tupu ọnwụ ya, Ada mere ọtụtụ ihe nkiri gụnyere Domitila, 30 Days in Atlanta, nakwa The Johnsons bụ nke e ji maara ya karịa.

Na-agbanyeghi na aha ya bụ Ada bụkwanụ aha ndị Igbo na-agụ ụmụ ha mana ọ bụghị nwafọ Igbo.

Ndị ọzọ a ma ama na Naịjirịa nwụrụ n'afọ a

Sammie Okposo

Ebe foto si, Sammie Okposo/Instagram

E nwekwara ọtụrụ ndị ọzọ a ma ama na Naịjirịa nwụrụ n'afọ a na-abụghị ndị Igbo mana ọnwụ ha dara ụda.

Ndị a gụnyere; otiegwu Sammie Okposo, omeihe nkiri bụ Lari Williams na Gbenga Richards, ụkọchukwu Ezekiel Atang.

Ndị ọzọ bụ onye cguburu Najirịa nwa mgbe nta Ernest Sonekan, Ọba ndi Ibadan bụ Saliu Akanmu Adetunji, Ọba ndị Oyo bụ Lamidi Adeyemi III, onye na-achịteanya Naịjirịa na mba Spen bụ Demola Seriki na ndị ọzọ.