Mbazulike Amechi: Ịyọm Chinelo Amechi bụ nwunye ghọrọ m nne mgbe nne m lara mụọ

Ebe foto si, Mbazulike Amechi
Ịyọm Chinelo Amechi bụ nwunye onye okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria na mịnịsta njem Ugbọelu mbụ Naijiria bụ Mbazulike Amaechi nwụrụ na nsonso a (23/7/2021)ka ọ gbachara afọ 91.
Odoziakụ Amechi nwụrụ n'ụlọọgwụ 'Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital' (NAUTH), Nnewi ka ọ rịachara ọrịa nwa oge.
Di ya bụ onye 'Zikist'-ndị soro Nnamdi Azikiwe ha were lụọ ọgụ nnwereonwe Naijiria-kọwara BBC Igbo na nwunye ya,"Ọ bụ ezigbo nwaanyị.Kemgbe nne m nwụrụ n'afọ 1983,ọ bụụrụ nne m nakwa nwunye m."
Ka ọ dị ugbua, a ka na-eche atụmatụ mmemme olili ozu ya.
Lee ụfọdụ ndị ị maghị maka nwaanyị a nke mere ka gbubie kwenye ya na ya agaghị alụ nwaanyị ganye na Naijiria enwetara nnnwereonwe:
- Onye Umuoji a na-alụ onye Ụkpọ dịkwa n'Anambra steeti,

Ebe foto si, Mbazulike Amechi
- Iyọm na di ya bụ Mbazulike zutere onwe ha n'ọnwa Eprelu afọ 1960 dịka nwanne Ịyọm Chinyere tọrọ ya bụ Kate Okoye ya na Mbazulike na-arụ n'otu ụlọrụ rịrịọ ya ka o mere ya onyeisioche na mmemme nnabata e mere Ịyọm Chinyere dịka o si ala Bekee ebe ọ gara gụọ akwụkwọ lọta.
- Ọ bụ onye nọọsụ tụpu ọ laa ezumike nka n'afọ 1983, ọ chịkọtara ezinaụlọ ya nakwa ọrụ ya ma bụrụkwa onye na-agba mbọ n'ụka.

Ebe foto si, Mbazulike Amechi
Dịka ezinaụlọ ya siri kwuo, a ga-eme ka ndị ọha mmadụ mata maka usoro olili ozu ya ma e hiwe ya.









