Sound Sultan: Otiegwu Naịjirịa a ama ama alala mmụọ

Ebe foto si, Sound Sultan Instagram/Lamboghini
Olanrewaju Fasasi bụ otiegwu e ji Sound Sultan mara na Naịjirịa alala mmụọ.
Akwụkwo na-egfegharị na soshal midia nke bu mbinye aka Dr Kayode Fasasi kwuru na Sound Sultan nwụrụ site ọrịa 'Angioimmunoblastic T-Cell Lymphoma' n'ụbọchị Jụlaị 11, 2021.
Kayode depụtakwara na Sound Sultan nwụrụ n'afọ iri anọ na anọ(44).
Ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ atọ ya lawa mmụọ.

Ebe foto si, Sound Sultan Facebook
Tuface Idibia ya na Sound Sultan dị n'ezigbo mma depụtara obi mgbawa ya gbasara ọnwụ ezigbo ọyị ya n'elu akara facebook ya ma tinyekwa akwụkwọ ozi ahụ bu mbinye aka Dr Kayode.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Nwanne ya nwoke na-etikwa egwu ma na-emekwa ihe nkiri e ji Babadee mara tinyekwara ozi maka ọnwụ Sound Sultan n'elu instagram ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
N'ụbọchị May 12, 2021 ka akụkọ pụtara na ahụ esichaghị ya ike.
Lekwa ihe ikpeazụ Sound Sultan wepụtara n'akara Instagram

Ebe foto si, Google
Sound Sultan tinyere egwu otiegwu Patoranking n'elu instagram ya bụ ozi ikpeazụ tupu enweta akụkọ na ọ lala mmụọ
Egwu ahụ na-ekwu ka ndị mmadụ too ya ugbua ọ dị ndụ kama mgbe ọ nwụrụ.
Nke a mere ka ndị na-ezite ozi n'okpuru egwu ahụ na-ekwu na ọ dịka ọ ma na ọ ga-anwụ were tinye egwu ahụ.
Ihe ndị kwesiri ịma maka otiegwu a kopuru ụwa n'afọ 90s
- Sound Sultan bụ onye Oyo steeti
- Ọ bụ otiegwu, odee egwu, onye na-akpaọchị, nakwa onye enyere ndị ka na-amalite ịgụ egwu ọhụru aka.
- A mụrụ ya n'ụbọchị Novemba 27, 1976
- Ọ bụ nwa nke anọ n'etiti ụmụaka isii nne ya mụrụ
- Aha nna ya bụ Liadi Alarape Fasasi ,nke nne ya bụ Adeyinka Ajarat Fasasi
- Ọ gụrụ Steeping Stone Primary School dị na Legos site na afọ 1981 ruo 1987
- Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndiri na 'federal goment college Ogbomosho' site na 1988 ruo 1993
- Ọ gụrụ 'Geography na regional planning' na mahadum Lagos state university n'afọ 1999
Ihe gbasara itiegwu ya
Ndị mmadụ ma Sound Sultan dịka otu n'ime ndị so mee ka egwu chakee na Naịjịrịa.
Ọ malitere itiegwu ya n'afọ 1990s.
O gosiri mmasị ya n'itiegwu n'afọ 1991 mgbe ọ nọ na ụlọakwụkwọ tupu o bido dewe egwu nke ya.
O bidoro mụwa ikpọ ụbọ mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndiri , n'afọ 1999 o malitere otu egwu nke ya.
O na-ekwukarị na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ BabaDee nyere ya aka chakee n'itiegwu.
N'afọ 2000, ka o tiputere egwu akpọrọ 'Jagbajantis' nke mere ka aha wuwe ebe niile.
Sound Sultan arụọla ọrụ dịka onyegwu n'okpuru ụlọọrụ Kennis music n'afọ 1997 nakwa Naija Ninjas site n'afọ 2008 ruo ugbua.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
- Ihe isii Ohaneze ndị Igbo kpebiri maka nwụchịgharị na ikpe Nnamdi Kanu
- Ndị Ipob amalitela ngagharịiwe maka Nnamdi Kanu na mba ụwa
- E chiela nwaanyị ụkọchukwu na Naijirịa mbụ kama ọdabachaghị - Ụkọchukwu Anglịkan, Okey Ifionu
- Akụkọ na Gọvanọ Ikpeazu kwuru ka atụọ nnamdi Kanu nga bụ akụkọ ụgha - John Okiyi









