Oke Obi-Enadhuze: Ụwa na-akwa arịrị maka ọnwụ ya, mana onye ka ọ bụ?

Ebe foto si, @DANIELOE16
Ọyị nwaanyị Oke Obi-Enadhuze bụ derinmama arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha tụkọta ego nye ndị bee ọyị ya nwoke makana ndị omekome lara ngwogwo niile ha ji biri n'iyi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a mere ka a malite tụkọtabara ezinulọ Oke ego na GofundMe.
Ego ahụ eruola pound 7,859 ugbua.

Ebe foto si, GoFundMe website
Cheta na ndị ntoroọbịa Naịjirịa nakwa ụfọdụ ndị mba ụwa ka na-akwa arịrị maka ọnwụ Oke Obi-Enadhuze n'elu soshal midia.
Oke Obi Enadhuze bụ nwamadị akụkọ kwụrụ na ọ nwụrụ ka ọgbaghara ogbugbu ndị na-eme ngaghariwe na Lekki toll gate n'ụbọchị Oktoba 20,2020 dapụtachara.
Odochabeghị anya etu Enadhuze si nwụọ.
Akụkọ ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ mgbọ ojii tụrụ ya oge a na-egbochi ndị na-eme ngagharịiwe.
Mana otu onye aha ya bụ Modorima Shintaro na Twitter, onye sị na ya bụ nwanne Oke, kọrọ etu o si nwụ, ma kwuo na ọ bụ mgbe ndị na-agboro wakporo ha n'ụlọ ha ka ha ji mma sụgbuo ya.
BBC ka na-enyocha ihe niile a iji chọpụta nke bụ eziokwu kpọmkwem.
Mana lee ihe ndị ọzọ anyị chọpụtara maka nwa amadị a
Oke Obi Enadhuze bụ onye nhazi teknụzụ na-eme ka ibi ndụ dịrị ụmụ ụwa mfe nke a na-akpọ App designer n'asụsụ bekee.
Enadhuze gụrụ compụta sayensi na mahadum Federal University of Abeokuta.
Ọ na-arụ n'ụlọ ọrụ akpọrọ 'Life bank Nigeria'.
Onyeisi Oke n'ọrụ bụ Ayo olufemi Michael kwuru na Oke arụọrụla ha teknụzụ ha mabeghị ma o nwere onye ga-arụ na nso nso a.
O kwuru na ha hụbeghị udiri ọnatarachị Oke nwere ma bịa n'ihe gbasara teknụzụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ Oke Obi-Enadhuze na sọshal midia
Derinmama bụ ọyị nwaanyị Oke pụtara jiri akara twitter ya depụta obi mgbawa ya maka etu e si sugbuo ọdịnobi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O depụtekwara na ihe Daniel Oke Enadhuze kọrọ n'akara twitter ya maka etu Oke Obi-Enadhuze si nwụọ bụ eziokwu.
Mana ọtụtụ mmadụ na-ekwu na soshal midia na ọnya dị n'ahụ Oke tupu ọ nwụọ dị ka ọnya mgbọ egbe tụrụ ya.
Temie Giwa-Tubosun bụ onye ụlọ ọrụ nwa amadi kwuru na Enadhuze haziri teknụzụ na-enye aka ndi nwee ike ịtụkọta ọbara ha iji nyere ndị ọbara ha gbaturu aka. O kwukwara na o ji naanị abalị anọ hazie ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Seiyefatj kwuru na ọnwụ Enadhuze na-ewute ya nke ukwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Nubiudodo kwuru ka chukwu gbadata nyere Naịjirịa aka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5









