Ndị Ipob amalitela ngagharịiwe maka Nnamdi Kanu na mba ụwa

Ipob protests

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) amalitela njem ngagharịiwe na mba ofesi dị iche iche maka nwụchi gọọmentị Naịjirịa nwụchịagharịrị onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu.

Na mba Jamịnị, ndị otu Ipob mere ngagharị iwe ha gaa ụlọọrụ na-anọchịte anya Kenya nakwa nke Briten dị na mba ahụ.

N'ihe onyonyo BBC hụrụ na Facebook, ọtụtụ ndị otu Ipob ji ọkọrọtọ Biafra ma na-agụ egwu n'okporo ụzọ na Berlin bụ isi obodo Jamịnị.

Onyesisi ngalaba Ipob a kpọrọ Directorate of State (DOS) bụ Chika Edoziem - bụ onye na-anọchite anya dịka onyeisi Ipob ugbua - n'okwu o kwuru banyere ngagharịiwe a ndị Ipob na-eme sị na ọ bụ ụzọ atọ ka ha ji agba mbọ ịhụ na atụghapụrụ onyeisi ha.

Ọ sị ha na ha si ụzọ ụlọikpe site n'aka ndị ọkaiwu na-arụrụ ha ọrụ, sikwa n'aka ndị ma maka mmekọrịta mba na mba, nakwa ụzọ nke ikpeazụ bụ atụmatụ ngagharịiwe a ha na-eme.

Ipob protests in UK

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Ipob na-ebo mba Kenya ebubo na ọ bụ ha nwụchịrị Kanu were kpọnye ya mba Naịjirịa, mana mba Kenya ekwuola n'aka ha adịghị na ya.

Ọkaiwu na-anọchite anya Ipob bu Ifeanyi Ejiofor gara BBC Igbo na nwere akaebe na-atara Maazị Kanu ahụhụ na mba Kenya tupu a kpọlata ya Naịjiria.

Onwebeghị akaebe e nwere maka ebubo a Ọkaiwu Ejiofor na-ebo mba Kenya.

N'okwu ngagharịiwe, a na-ele anya na ndị Ipob ga-eme ya na mba ndị ọzọ gụnyere ndị nke ha mere ya ugbua.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

N'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jụlaị, ndi Ipob mekwara ngagharịiwe gaa ụlọọrụ na-anọchite mba Briten na Amerịka nakwa Kanada dịka onyonyo ha tinyere na Youtube siri gosi.

Amabeghị ma ngagharịiwe ndị a ọ ga-enye aka mee ka mba ụfọdụ tinye ọnụ n'okwu Maazị Kanu bụ onye Naịjirịa boro ebubo ịkpa nkata migide Naịjirịa naka iyi ndụ egwu.

N'ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlai Maazị Kanu ga-alachite ụlọikpe ebe Ọkaikpe Binta Nyako na-ekpe ikpe.